Emọs
7 Ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gosiri m: O mere ka ìgwè igurube pụta n’oge mkpụrụ ndị a ghara n’ikpeazụ* malitere ipulite. Ha bụ mkpụrụ ndị a ghara n’ikpeazụ mgbe e gbutechaara eze ahịhịa. 2 Mgbe igurube ndị ahụ tachara ahịhịa dị n’ala a, m sịrị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, gbaghara.+ Ebe ọ bụ na Jekọb esighị ike, olee otú ọ ga-esi dịrị ndụ?”*+
3 N’ihi ya, Jehova gbanwere obi ya n’ihe a.*+ Jehova kwuru, sị: “Ọ gaghị eme.”
4 Ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gosiri m: Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ka e jiri ọkụ taa ala ahụ ahụhụ. Ọkụ wee repịa nnukwu ogbu mmiri, repịakwa ibé ala ahụ. 5 M wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, o zuola.+ Ebe ọ bụ na Jekọb esighị ike, olee otú ọ ga-esi dịrị ndụ?”*+
6 N’ihi ya, Jehova gbanwere obi ya n’ihe a.*+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Nke ahụkwa agaghị eme.”
7 Ihe a ka o gosiri m: Jehova guzo ná mgbidi, e jikwa eriri e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ tụọ mgbidi ahụ mgbe a na-arụ ya. O jikwa eriri ahụ n’aka. 8 Jehova wee sị m: “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” M wee sị: “Eriri e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ.” Jehova asịzie: “Ana m etinye eriri a n’ebe ndị Izrel bụ́ ndị m nọ. M gaghịzi agbaghara ha.+ 9 Ebe ndị dị elu Aịzik rụrụ+ ga-aghọ ikpo nkume. A ga-alakwa ụlọ nsọ dị iche iche dị n’Izrel n’iyi.+ M ga-ejikwa mma agha bibie ezinụlọ Jeroboam.”+
10 Amazaya onye nchụàjà Betel+ zigaara Jeroboam+ eze Izrel ozi a: “Emọs nọ n’ihu ndị Izrel na-agba izu ihe a ga-eme gị.+ Ihe niile o kwuru na-agba ndị bi n’ala a agba ná ntị.+ 11 Ihe a bụ ihe Emọs kwuru, ‘A ga-eji mma agha gbuo Jeroboam. E nweghịkwa ihe ga-eme ka a ghara isi n’ala ndị Izrel dọrọ ha n’agha.’”+
12 Amazaya wee sị Emọs: “Onye ọhụụ, gbara ọsọ gawa Juda. Kpawa afọ gị* ebe ahụ, nọrọkwa ebe ahụ buwe amụma.+ 13 Ebuzila amụma na Betel,+ n’ihi na ọ bụ ụlọ nsọ nke eze+ nakwa ebe ụlọ nsọ nke alaeze dị.”
14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma na mbụ, abụghịkwa m nwa onye amụma. Kama abụ m onye na-azụ atụrụ+ nakwa onye na-elekọta* mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ. 15 Ma, Jehova si ebe m nọ na-azụ atụrụ kpọrọ m. Jehova gwakwara m, sị, ‘Gaa buoro Izrel bụ́ ndị m amụma.’+ 16 Ugbu a, nụrụ ihe Jehova kwuru: ‘Ị na-asị, “Ebula amụma na e nwere ihe a ga-eme Izrel.+ Ekwusakwala na e nwere ihe a ga-eme ezinụlọ Aịzik.”+ 17 N’ihi ya, ihe a ka Jehova kwuru: “Nwunye gị ga-aghọ akwụna n’obodo. A ga-ejikwa mma agha gbuo ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị. A ga-ejikwa ụdọ e ji atụ̀ ihe kerie ala gị. Ị ga-anwụkwa n’ala na-adịghị ọcha. O nweghịkwa ihe ga-eme ka a ghara isi n’ala ndị Izrel dọrọ ha n’agha.”’”+