Emọs
1 Ihe a gwara Emọs* n’ọhụụ gbasara Izrel. Emọs so ná ndị Tekoa+ na-azụ atụrụ. A gwara ya ihe a n’oge Eze Ọzaya+ na-achị Juda nakwa n’oge Jeroboam+ nwa Joash+ bụ eze Izrel. Ọ hụrụ ọhụụ a afọ abụọ tupu e nwee ala ọma jijiji.+ 2 Ọ sịrị:
“Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ.
Ọ ga-esikwa na Jeruselem mee ka a nụ olu ya.
Ala anụmanụ na-ata ahịhịa, nke ndị ọzụzụ atụrụ na-edu atụrụ ha aga, ga-eru uju.
Ahịhịa ndị dị n’elu elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.”+
3 “Jehova kwuru, sị:
‘“N’ihi isi ndị Damaskọs nupụrụ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha ji ígwè e ji eticha ọka tipịa Gilied.+
5 M ga-agbaji ihe e ji atụchi Damaskọs.+
M ga-ebibi ndị bi na Bikat-evin,
Bibiekwa onye nọ na Bet-iden na-achị.*
A ga-adọrọkwa ndị Siria n’agha laa Kia.”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’
6 Jehova kwukwara, sị:
‘“N’ihi isi ndị Gaza nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha+ kpọnye Ịdọm.
M ga-ata Ekrọn+ ahụhụ.
Ndị Filistia fọrọnụ ga-alakwa n’iyi.”+ Ọ bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’
9 Jehova kwukwara, sị:
‘N’ihi isi ndị Taya nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha kpọnye Ịdọm,
Nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne.+
10 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Taya.
Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.’+
11 Jehova kwuru, sị:
‘N’ihi isi ndị Ịdọm nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha ji mma agha chụọ ụmụnne ha ọsọ,+
Nakwa n’ihi na ha emereghị ha ebere.
Ha ji iwe na-adọri ha n’akwụsịghị akwụsị,
Ha bukwaara ha iwe n’obi mgbe niile.+
12 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Timan.+
Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Bọzra.’+
13 Jehova kwuru, sị:
‘“N’ihi isi ndị Amọn nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,
N’ihi na ha bọwara ụmụ nwaanyị Gilied dị ime afọ iji nwetakwuo ala.+
14 N’ihi ya, m ga-amụnye mgbidi Raba+ ọkụ.
Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.
A ga-eti mkpu agha n’ụbọchị agha.
Oké ifufe ga-efekwa n’ụbọchị oké ifufe mmiri.
15 A ga-adọrọ eze ha n’agha, dọrọkwa ndị o mere ndị isi.”*+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’