Ilu
24 Enwerela ndị ọjọọ anyaụfụ,
Achọkwala ka gị na ha na-akpa,+
2 N’ihi na ihe ha na-eche n’obi ha bụ otú ha ga-esi mesie mmadụ ike,
Ihe ha na-ekwukwa mgbe niile bụ ihe ọjọọ ha ga-eme.
4 Mmadụ na-eji ihe ọ na-amụta
Eme ka ihe niile bara uru na ihe ọma niile ju n’ọnụ ụlọ ya dị iche iche.+
7 E nweghị ihe ga-eme ka onye nzuzu nwee ezigbo amamihe.+
E nweghị ihe ọ ma ọ ga-ekwu n’ọnụ ụzọ ámá obodo.
10 Ọ bụrụ na obi adaa gị mbà ma nsogbu bịara gị,
Ike ga-agwụ gị.
12 Ma ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe a,”
Ọ̀ bụ na Onye na-enyocha obi amaghị ihe dị gị n’obi?+
N’eziokwu, Onye na-ahụ gị ga-ama,
Ọ ga-akwụkwa onye ọ bụla ụgwọ ọrụ ya.+
13 Nwa m, na-aracha mmanụ aṅụ maka na ọ dị mma.
Mmanụ aṅụ nke si n’ụgbụgbọ aṅụ na-atapụta na-atọ ụtọ.
14 Marakwa na amamihe ga-abara gị uru.+
Ọ bụrụ na ị mara ihe, ihe ga-adịrị gị mma n’ọdịnihu,
Ihe ndị ị na-atụ anya ha ga-emekwara gị.+
15 Ezola n’akụkụ ụlọ onye ezi omume ka i mee ya ihe ọjọọ,
Emebikwala ebe o bi.
16 N’ihi na onye ezi omume nwere ike ịda ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha.+
Ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume daa daruo ala.+
17 Onye iro gị daa, enwela obi ụtọ.
Ọ bụrụ na ọ zọhie ụkwụ, aṅụrịla ọṅụ.+
19 Ewerela ndị na-eme ihe ọjọọ iwe.
Enwerela ndị ajọ omume anyaụfụ,
20 N’ihi na ihe agaghị adịrị onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ mma n’ọdịnihu.+
A ga-emenyụ ọkụ* ndị ajọ omume.+
21 Nwa m, tụọ egwu Jehova, tụọkwa egwu eze.+
Ònye ma ụdị mbibi ha abụọ* ga-ebibi ndị nnupụisi a?+
23 Ndị ma ihe na-ekwukwa, sị:
Ile mmadụ anya n’ihu mgbe a na-ekpe ikpe adịghị mma.+
24 Onye ọ bụla nke sịrị onye ajọ omume, “Ị bụ onye ezi omume,”+
Ndị mmadụ ga-abụ ya ọnụ, mba dị iche iche ga-akatọkwa ya.
25 Ma ihe ga-agaziri ndị na-abara onye ajọ omume mba.+
A ga-eji ọtụtụ ihe ọma gọzie ha.+
26 Ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu eziokwu mgbe ọ na-asa okwu, ndị mmadụ ga-akwanyere ya ùgwù.*+
27 Hazie ọrụ gị dị n’èzí, kwadebekwa ihe niile n’ubi.
I mechaa, rụọ ụlọ* gị.
28 Agbala akaebe na e nwere ihe onye agbata obi gị mere ma ọ bụrụ na i jighị n’aka na o mere ihe ahụ.+
Ekwula ihe ga-eduhie ndị ọzọ.+
29 Asịla: “M ga-emegwara ya ihe o mere m.
M ga-akwụ ya ụgwọ ihe o mere m.”+
31 Ahụrụ m na ahịhịa eruchiela ya.
32 Ahụrụ m ihe a ma chebara ya echiche.
M hụrụ ya wee mụta na
33 Ihitụ ụra, irotụ ụra,
Na ịkụkụwatụ aka ka i zuo ike
34 Ga-eme ka ị daa ogbenye na mberede ka à ga-asị na onye ohi zuru gị ohi na mberede.
Ị ga-adakwa ụkpa ka à ga-asị na mmadụ ji ngwá ọgụ bịa nakọrọ gị ihe niile i nwere.+