Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
12 N’ihi ya, ụmụnna m, ebe ọ bụ na Chineke na-emetere anyị ebere,* ana m arịọ unu ka unu nyefee ya ahụ́ unu+ ka àjà dị ndụ, nke dị nsọ,+ nke dịkwa Chineke mma. Unu ga-esi otú a jiri echiche unu+ na-ejere ya ozi. 2 Kwụsịkwanụ ịna-eme omume otú ndị oge a* si eme, kama gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche,+ ka unu wee chọpụta+ ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.
3 N’ihi na ebe Chineke meere m amara, ana m agwa unu niile nọ n’ebe ahụ ka a ghara inwe onye na-eche na ya bara uru karịa otú ọ bara,+ kama ka onye ọ bụla na-eche echiche otú gosiri na ọ na-ele ihe anya otú dị mma n’ihi okwukwe Chineke nyere ya.+ 4 N’ihi na otú ahụ ahụ́ anyị nwere akụkụ dị iche iche,+ ma ha niile anaghị arụ otu ọrụ, 5 otú ahụkwa ka ọ dị anyị. N’agbanyeghị na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ́ n’ihi na anyị na Kraịst dị n’otu, ma anyị niile n’otu n’otu bụ ihe dị iche iche dị n’otu ahụ́.+ 6 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị nwere onyinye dị iche iche n’ihi amara Chineke meere anyị,+ ọ bụrụ amụma ka anyị na-ebu, ka anyị na-ebu ya n’ihi okwukwe e nyere anyị. 7 Ọ bụrụ ozi ka anyị na-eje, ka anyị na-eje ozi a; ma ọ bụ, ọ bụrụ onye na-ezi ihe, ya ziwe ihe ọ na-ezi.+ 8 Ọ bụrụ onye na-agba ndị ọzọ ume,* ya gbawa ha ume;*+ onye na-ekesa ihe,* ya na-emesapụ aka ma ọ na-ekesa ya.+ Onye na-edu ndị ọzọ, ya jiri obi ya niile* na-edu ha.+ Onye na-eme ebere, ya gbasapụ ihu ma ọ na-eme ya.+
9 Ka ịhụnanya unu ghara ịbụ ịhụnanya ihu abụọ.+ Kpọọnụ ihe ọjọọ asị;+ na-agbasinụ mbọ ike ka unu na-eme ihe ọma.* 10 Na-ahụnụ ibe unu n’anya ka ụmụnne, na-enwekwaranụ ibe unu ọmịiko. Na-ebunụ ụzọ asọpụrụ ndị ọzọ.+ 11 Na-arụsinụ ọrụ ike.* Unu adịla umengwụ.+ Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi.+ Bụrụnụ ndị ohu Jehova.*+ 12 Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’ihi olileanya unu nwere. Na-atachinụ obi mgbe a na-akpagbu unu.+ Nọgidenụ na-ekpe ekpere.+ 13 Na-enyenụ ndị nsọ ihe na-akpa ha.+ Na-elenụ ọbịa.+ 14 Na-agọzinụ ndị na-akpagbu unu;+ na-agọzinụ ndị mmadụ, unu abụkwala ndị mmadụ ọnụ.+ 15 Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-ebe ákwá bee ákwá. 16 Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu; unu adịla mpako,* kama dịnụ umeala n’obi.+ Unu amala ihe n’anya onwe unu.+
17 Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.+ Na-emenụ ihe mmadụ niile ga-ewere na ọ dị mma. 18 Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.+ 19 Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma* ohere;+ n’ihi na e dere, sị: “‘Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.’ Ọ bụ ihe Jehova* kwuru.”+ 20 Ma, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri. Ọ bụrụ na mmiri na-agụ ya, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ; n’ihi na i mee otú ahụ, ị ga-ekpokwasị icheku ọkụ n’isi ya.”*+ 21 Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama na-eme ihe ọma ka i wee merie ihe ọjọọ.+