Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti
5 Ejila iwe agwa okenye okwu.+ Kama, na-agwa ya okwu otú i si agwa nna gị, na-agwakwa ụmụ okorobịa okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwoke. 2 Na-agwakwa ụmụ nwaanyị merela agadi okwu otú i si agwa ndị nne, na-agwakwa ụmụ agbọghọ okwu otú i si agwa ụmụnne gị ndị nwaanyị, n’ebughị ihe ọjọọ ọ bụla n’obi.
3 Na-akwanyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ndị nọ ná mkpa,* ùgwù, na-elekọtakwa ha.+ 4 Ma ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla di ya nwụrụ mụrụ ụmụ ma ọ bụ na o nwere ụmụ ụmụ, ha buru ụzọ lekọta ndị ezinụlọ ha+ iji gosi na ha na-efe Chineke. Ha kwesịrị ịna-emere ndị nne na nna ha na ndị nne nne ha na ndị nna nna ha ihe ha kwesịrị imere ha.+ Ọ na-amasị Chineke ma ha na-eme otú a.+ 5 Ma nwaanyị isi mkpe, nke nọ ná mkpa n’eziokwu, atụkwasịla Chineke obi.+ Ọ na-arịọsikwa ya arịrịọ ike, na-ekpe ekpere ehihie na abalị.+ 6 Ma nwaanyị isi mkpe, nke na-eme ihe na-agụ ahụ́ ya agụụ,* nwụrụ anwụ, ọ bụ eziokwu na ọ dị ndụ. 7 N’ihi ya, na-akụziri ha ihe ndị a, ka a ghara ịna-ekwujọ ha. 8 N’eziokwu, ọ bụrụ na mmadụ anaghị egboro ndị nke ya mkpa ha, nke ka nke, ndị ezinụlọ ya, onye ahụ ajụla Chineke, jọkarịakwa onye na-ekweghị na Chineke ná njọ.+
9 Ka nwaanyị dị afọ iri isii gbagowe, nke di ya nwụrụ, soro ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa. Ọ ga-abụkwa onye na-agbaghị n’èzí mgbe di ya nọ ndụ.* 10 O kwesịkwara ịbụ onye e ji ịrụ ọrụ ọma mara,+ onye zụrụ ụmụ ya nke ọma,+ onye lere ọbịa,+ onye sara ụkwụ ndị nsọ,+ onye nyeere ndị nọ n’ahụhụ aka,+ onye jikwa ụdị ọrụ ọma niile kpọrọ ihe.
11 Ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, bụ́ ndị na-emebeghị agadi, esoghị ná ndị a ga-agụnye na ha nọ ná mkpa, n’ihi na ịlụ di na-abụ mkpa ha mgbe agụụ mmekọahụ chịwara ha, kama ijere Kraịst ozi. 12 A ga-ama ha ikpe n’ihi na ha emeghịzi ihe ha kwere ná nkwa na mbụ. 13 Ha na-anọkwa nkịtị, na-epiogharị n’ụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha na-anọ nkịtị, ha na-agbakwa asịrị, na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha,+ na-ekwukwa ihe ndị ha na-ekwesịghị ikwu. 14 N’ihi ya, achọrọ m ka ụmụ nwaanyị na-emebeghị agadi, ndị di ha nwụrụ, lụọ di.+ Ka ha mụọkwa ụmụ,+ na-elekọta ezinụlọ ha, ka a ghara inwe ihe ndị na-emegide anyị ga-eji kwujọọ anyị. 15 N’eziokwu, ụfọdụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ akwụsịla ife Chineke, sorozie Setan. 16 Ọ bụrụ na nwaanyị ọ bụla bụ́ Onye Kraịst nwere ndị ikwu bụ́ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, ya nyere ha aka, ka ọgbakọ ghara ibu ibu ha. Ọ ga-eme ka ọgbakọ nwee ike ịna-enyere ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ nọ ná mkpa aka.*+
17 E kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye na-arụ ọrụ ha nke ọma+ ùgwù okpukpu abụọ,+ karịchaa, ndị na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.+ 18 N’ihi na Akwụkwọ Nsọ sịrị, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha ọka.”*+ Ọ sịkwara, “E kwesịrị ịkwụ onye ọrụ ụgwọ ọrụ ya.”+ 19 Ekwetala ebubo e boro okenye, ọ gwụla ma è nwere mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ gbara akaebe ya.+ 20 Nọrọ n’ihu mmadụ niile dọọ ndị na-eme mmehie+ aka ná ntị,+ ka ụjọ ime mmehie wee tụọ ndị ọzọ. 21 Ana m agwasi gị ike n’ihu Chineke, na n’ihu Kraịst Jizọs, na n’ihu ndị mmụọ ozi Chineke họọrọ, ka i lezie anya na-eme ihe ndị a n’eleghị onye ọ bụla anya n’ihu.+
22 Ebikwasịla onye ọ bụla aka n’isi ngwa ngwa.*+ Aka gị adịkwala ná mmehie ndị ọzọ. Debe onwe gị ọcha.
23 Aṅụzila mmiri ọzọ,* kama na-aṅụ ntakịrị mmanya n’ihi afọ gị na ọrịa ị na-arịakarị.
24 E nwere ụfọdụ ndị mmehie ha na-agba n’anwụ ozugbo, ya emee ka a maa ha ikpe. Ma, mmehie ndị nke ọzọ na-agba n’anwụ ka oge na-aga.+ 25 Otú ahụkwa ka ndị mmadụ na-ama mgbe a rụrụ ọrụ ọma.+ A gaghịkwa ezochili ọrụ ọma ọ bụla ndị mmadụ na-amaghị mgbe a rụrụ ya.+