Jona
4 Ma ihe a wutere Jona nke ukwuu, ya ewee ezigbo iwe. 2 N’ihi ya, o kpere ekpere sị Jehova: “Chaị, Jehova, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe a nọ na-enye m nsogbu n’obi mgbe m nọ n’ala m? Ọ bụ ya mere m jibu chọọ ịgbaga Tashish+ n’ihi na ama m na ị bụ Chineke nwere ọmịiko* ma na-eme ebere, onye na-anaghị ewe iwe ọsọ ọsọ, onye ịhụnanya ya* dị ukwuu,+ onye ọdachi na-ewutekwa. 3 Ugbu a, Jehova, biko, mee ka m nwụọ,* n’ihi na ọ kaara m mma ịnwụ karịa ịnọ ndụ.”+
4 Jehova jụrụ ya, sị: “Iwe ị na-ewe ò kwesịrị ekwesị?”
5 Jona wee pụọ n’obodo ahụ, gaa nọdụ ala n’ebe ọwụwa anyanwụ obodo ahụ. Ọ rụụrụ onwe ya ụlọ ndò n’ebe ahụ ma nọrọ na ndò ya ka ọ hụ ihe ga-eme obodo ahụ.+ 6 Jehova Chineke wee mee ka osisi ogiri ụgba pulite kpuchie Jona, ka ọ bụụrụ isi ya ndò ma mee ka o nwetatụ onwe ya. Obi wee dị Jona ezigbo ụtọ n’ihi osisi ogiri ụgba ahụ.
7 Mgbe chi bọwara n’echi ya, ezi Chineke mere ka ọtị pụta. O wee taa osisi ogiri ụgba ahụ, ya akpọnwụọ. 8 Mgbe anwụ chawara, Chineke mekwara ka ifufe dị ọkụ nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ fee. Anwụ wee na-achasi Jona ike n’isi, ya achọwa ịtụbọ. Ọ nọ na-arịọ ka ya nwụọ.* Ọ nọ na-asị, “Ọ kaara m mma ịnwụ karịa ịnọ ndụ.”+
9 Chineke jụrụ Jona, sị: “Iwe ị na-ewe n’ihi osisi ogiri ụgba a ò kwesịrị ekwesị?”+
O wee sị: “M kwesịrị iwe iwe. Ezigbo iwe na-ewe m nke na m chọrọ ịnwụ.” 10 Ma Jehova kwuru, sị: “I meteere osisi ogiri ụgba ebere, nke ị na-arụghịrị ọrụ ma ọ bụ mee ka o too. O toro n’otu abalị ma nwụọ n’otu abalị. 11 Ọ̀ bụ na ekwesịghịkwa m imere Ninive bụ́ obodo ukwu ebere,+ bụ́ ebe e nwere ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku iri abụọ (120,000) ndị na-amaghịdị ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ* nakwa ọtụtụ anụmanụ ha?”+