Ndị Eze nke Mbụ
15 N’afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Eze Jeroboam+ nwa Nibat, Abaịjam malitere ịchị Juda.+ 2 Ọ chịrị afọ atọ na Jeruselem. Aha nne ya bụ Meaka,+ nwa nwa Abishalọm. 3 Mmehie niile nna ya mere ka yanwa nọ na-eme. O jighị obi ya niile fee Jehova bụ́ Chineke ya. O meghị ka Devid nna nna ya, onye ji obi ya niile fee Chineke. 4 Ma n’ihi Devid,+ Jehova bụ́ Chineke Abaịjam họpụtara onye si n’ezinụlọ Abaịjam ka ọ na-achị Jeruselem.*+ Chineke ekweghịkwa ka a kpa Jeruselem aka. 5 Jehova mere ihe a maka na Devid mere ihe ziri ezi n’anya ya. O nweghịkwa iwu ya ọ bụla ọ kwụsịrị idebe n’oge niile ọ nọ ndụ, ma e wezụga ihe o mere Yuraya onye Het.+ 6 Rehoboam na Jeroboam nọ na-alụso ibe ha agha n’oge niile Rehoboam nọ ndụ.+
7 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Abaịjam na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.+ Abaịjam na Jeroboam lụsokwara ibe ha agha.+ 8 Mgbe e mechara, Abaịjam nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ, ha elie ya n’Obodo Devid. Esa nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.+
9 N’afọ nke iri abụọ n’ọchịchị Jeroboam eze Izrel, Esa malitere ịchị Juda. 10 Ọ nọ na Jeruselem chịa afọ iri anọ na otu. Aha nne nna ya bụ Meaka+ nwa nwa Abishalọm. 11 Esa mere ihe ziri ezi n’anya Jehova,+ otú Devid nna nna ya mere. 12 Ọ chụpụrụ ụmụ nwoke bụ́ ndị akwụna* n’obodo ya,+ wepụchaakwa arụsị niile na-asọ oyi,* ndị nna nna ya hà kpụrụ.+ 13 Ọ chụtukwara Meaka+ bụ́ nne nna ya n’ọkwá ka ọ gharazie ịbụ nnukwu nwaanyị.* Ọ chụturu ya maka na o mere arụsị jọgburu onwe ya a na-eji efe ogwe osisi arụsị.* Esa gbuturu arụsị ahụ jọgburu onwe ya+ ma kpọọ ya ọkụ na Ndagwurugwu Kidrọn.+ 14 N’agbanyeghị na Esa ebibighị ebe ndị dị elu n’Izrel,+ o ji obi ya niile* jeere Jehova ozi ná ndụ* ya niile. 15 O webatakwara ọlaọcha, ọlaedo, na arịa dị iche iche ya na nna ya doro nsọ n’ụlọ Jehova.+
16 Esa na Beasha+ eze Izrel nọkwa na-alụso ibe ha agha oge niile. 17 Beasha eze Izrel lụsoro Juda agha, malitekwa ịrụsi Rema ike+ ka onye nọ ebe Esa eze Juda nọ ghara isi ebe ahụ pụọ ma ọ bụ ka onye na-anọghị ebe Esa nọ ghara ịbanye ebe ọ nọ.*+ 18 Esa wee nye ndị na-ejere ya ozi ọlaọcha niile na ọlaedo niile fọrọ n’ụlọ Jehova nakwa n’ụlọ* eze, ha ebugara ha Ben-hedad nwa Tabrimọn nwa Hiziọn eze Siria,+ onye bi na Damaskọs. Ọ gwakwara Ben-hedad, sị: 19 “Mụ na gị gbara ndụ. Nna m na nna gị gbakwara ndụ. M na-ebutere gị ọlaọcha na ọlaedo. Bịa mebie ọgbụgba ndụ gị na Beasha eze Izrel, ka o wee hapụ m.” 20 Ben-hedad gere Eze Esa ntị wee ziga ndị isi ndị agha ya, ha agaa lụso obodo ndị dị n’Izrel agha, bibie Aịjọn,+ Dan,+ Ebel-bet-meaka, obodo niile dị na Kineret, nakwa obodo niile dị na Naftalaị. 21 Ozugbo Beasha nụrụ ya, ọ kwụsịrị ịrụ Rema, ka birikwa na Teza.+ 22 Eze Esa kpọkọtara ndị Juda niile, e nweghị onye ọ hapụrụ, ha agaa buru nkume na osisi ndị Beasha ji na-arụsi Rema ike. Eze Esa jikwa ha rụsie Giba+ dị na Benjamin nakwa Mizpa ike.+
23 Ma e dere akụkọ ndị ọzọ niile gbasara Esa, ike niile ọ kpara, ihe niile o mere, nakwa obodo ndị ọ rụsiri ike,* n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda. Ma mgbe Esa mere agadi, ihe mere ya n’ụkwụ.+ 24 N’ikpeazụ, Esa nwụrụ otú nna nna ya hà nwụrụ, e lie ya ebe e liri ha n’Obodo Devid nna nna ya. Jehoshafat nwa ya+ nọchiri ya, malite ịchị.
25 Nedab+ nwa Jeroboam malitere ịchị Izrel n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Esa eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ. 26 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova, na-akpa àgwà ka nna ya,+ onye mmehie ya mere ka ndị Izrel mehie.+ 27 Mgbe Nedab na ndị Izrel niile nọchibidoro Gibetọn, Beasha nwa Ahaịja, onye ebo Ịsaka, gbaara ya izu, mechaakwa gbuo ya na Gibetọn,+ bụ́ obodo ndị Filistia. 28 Otú a ka Beasha si gbuo Nedab n’afọ nke atọ n’ọchịchị Esa eze Juda. O gburu ya ma nọchie ya, malite ịchị. 29 Ozugbo ọ malitere ịchị, o gburu ndị ezinụlọ Jeroboam niile. O nweghị onye na-eku ume n’ezinụlọ Jeroboam ọ hapụrụ. Ọ lara ha n’iyi otú Jehova si n’ọnụ ohu ya bụ́ Ahaịja onye Shaịlo kwuo.+ 30 Ihe mere o ji mee ha ihe a bụ n’ihi mmehie niile Jeroboam mere, ndị mekwara ka ndị Izrel mehie nakwa n’ihi ezigbo iwe ọ kpasuru Jehova bụ́ Chineke Izrel. 31 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Nedab na ihe niile o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Izrel. 32 Esa na Beasha eze Izrel nọkwa na-alụso ibe ha agha oge niile.+
33 N’afọ nke atọ n’ọchịchị Esa eze Juda, Beasha nwa Ahaịja nọ na Teza malite ịchị Izrel niile. Ọ chịrị afọ iri abụọ na anọ.+ 34 Ọ nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ na-akpa àgwà ka Jeroboam, onye mmehie ya mere ka ndị Izrel mehie.+