Aịzaya
12 Ị ga-asị n’ụbọchị ahụ:
“Jehova, m na-ekele gị,
N’ihi na ọ bụ eziokwu na ị na-ewesabu m iwe,
Iwe gị adajụọla, ị kasiekwala m obi.+
M ga-atụkwasị ya obi. M gaghịkwa atụ ụjọ.+
N’ihi na Jaa* Jehova bụ ike m na ume m.
Ọ bụ ya na-azọpụta m.”+
4 Unu ga-asịkwa n’ụbọchị ahụ:
“Keleenụ Jehova. Kpọkuonụ aha ya.
Kọọrọnụ mba dị iche iche ihe ndị ọ na-eme.+
Kpọsaanụ na aha ya dị ebube.+
5 Bụkuonụ Jehova abụ otuto,+ n’ihi na o meela nnukwu ihe dị iche iche.+
Meenụ ka a mara ihe a n’ụwa niile.
6 Ndị bi na Zayọn, tisienụ mkpu ike, tiekwanụ mkpu ọṅụ,
N’ihi na Onye Nsọ Izrel, onye unu na ya nọ, bụ onye ukwu.”