Esta
3 Mgbe ihe a mechara, Eze Ahazuirọs buliri Heman+ nwa Hamedeta, onye agbụrụ Egag,+ n’ọkwá, meekwa ka ọkwá ya karịa nke ndị isi ibe ya.+ 2 Ndị niile na-ejere eze ozi, bụ́ ndị na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá eze, na-ehulata na-akpọrọ Heman isiala, n’ihi na ọ bụ ihe eze nyere n’iwu ka a na-emere ya. Ma Mọdekaị anaghị ekwe ehulatara ya, ọ naghịkwa akpọrọ ya isiala. 3 Ndị na-ejere eze ozi, bụ́ ndị na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá eze, wee sị Mọdekaị: “Gịnị mere i ji na-ada iwu eze?” 4 Ha na-agwa ya ihe a kwa ụbọchị. Ma ọ naghị ege ha ntị. Ha gwaziri ya Heman ka ha mara ma ọ̀ ga-agbachi Mọdekaị nkịtị ka ọ na-eme ihe a ọ na-eme,+ n’ihi na Mọdekaị agwala ha na ya bụ onye Juu.+
5 Mgbe Heman hụrụ na Mọdekaị anaghị ehulatara ya, nakwa na ọ naghị akpọrọ ya isiala, iwe juru ya obi.+ 6 Ma, o weere ya na ya ewedala onwe ya ala ma ya gbuo* naanị Mọdekaị, n’ihi na ha agwala ya gbasara ndị obodo Mọdekaị. Heman wee chọwa otú ọ ga-esi gbuo ndị Juu niile nọ n’ógbè niile Ahazuirọs na-achị, bụ́ ndị obodo Mọdekaị.
7 N’ọnwa nke mbụ, ya bụ, n’ọnwa Naịsan,* n’afọ nke iri na abụọ+ n’ọchịchị Eze Ahazuirọs, ha fere Pua+ (ya bụ, Nza) n’ihu Heman ka a mata ụbọchị na ọnwa ọ ga-abụ, ya adaba n’ọnwa nke iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda.*+ 8 Heman wee gwa Eze Ahazuirọs, sị: “E nwere ndị gbasara+ n’ógbè* niile ị na-achị.+ Iwu ha dị iche na nke ndị niile ọzọ. Ha anaghịkwa edebe iwu eze. Ọ gaghị abara eze uru ma a hapụ ha ndụ. 9 Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e dee n’akwụkwọ na a ga-ala ha n’iyi. M ga-enye ndị na-ahụ maka akụnụba eze puku talent* ọlaọcha iri (10,000), ka ha tinye ya n’ebe eze na-edebe akụ̀.”*
10 Eze wee gbapụta mgbaaka o ji aka ihe akara,+ nye ya Heman+ nwa Hamedeta onye agbụrụ Egag,+ onye iro ndị Juu. 11 Eze gwakwara Heman, sị: “E nyela gị ọlaọcha,* nyekwa gị ndị ahụ ka i mee ha ihe ọ bụla masịrị gị.” 12 N’abalị iri na atọ n’ọnwa mbụ, a kpọkọtara ndị odeakwụkwọ eze,+ ha edee+ iwu niile Heman nyere ka e zigara ndị setrap eze, ndị gọvanọ na-achị ógbè* dị iche iche, na ndị isi nke ndị dị iche iche. Ha dere nke ógbè* ọ bụla otú ndị ebe ahụ si ede ihe, deekwa nke ndị ọ bụla n’asụsụ ha. E dere ya n’aha Eze Ahazuirọs, jirikwa mgbaaka eze ji aka ihe akara kaa ya akara.+
13 E dunyere ndị ozi ka ha ziga akwụkwọ ozi ndị ahụ n’ógbè* niile eze na-achị. Ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ ka e bibie ndị Juu, gbuo ha ma laa ha niile n’iyi n’otu ụbọchị, ma nwata ma agadi, ma ụmụntakịrị ma ụmụ nwaanyị. A ga-ebibi ha n’abalị iri na atọ n’ọnwa iri na abụọ, ya bụ, n’ọnwa Eda.+ A ga-akwakọrọkwa ihe ha.+ 14 Ihe dị n’akwụkwọ ozi ahụ ga-abụ iwu ndị nọ n’ógbè* niile ga-edebe. A ga-emekwa ka mmadụ niile mara ihe dị na ya, ka ha jikere maka ụbọchị ahụ. 15 Ndị ozi ahụ gawara ozugbo+ otú eze gwara ha. E tikwara iwu ahụ na Shushan,*+ bụ́ ebe obí eze dị.* Eze na Heman wee nọdụ ala ṅụwa mmanya. Ma Shushan* nọ n’ọgba aghara.