Job
12 Job wee sị:
2 “N’eziokwu, ọ bụ ununwa ma ihe,
Amamihe ga-esokwa unu nwụọ.
3 Ma m na-aghọtakwa ihe.
Unu akaghị m.
Olee onye na-amaghị ihe ndị a?
Onye ezi omume nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta bụzi onye e ji eme ihe ọchị.
5 Onye ihe na-agaziri na-achị ndị nsogbu bịaara ọchị,
Na-eche na ọ bụ naanị ndị nọ ná nsogbu* ka ọdachi na-adakwasị.
6 Obi ruru ndị ohi ala n’ụlọikwuu ha,+
E nweghịkwa onye na-enye ndị na-akpasu Chineke iwe nsogbu,+
Bụ́ ndị na-ebu chi ha n’aka.
7 Ma, biko jụgodị ụmụ anụmanụ. Ha ga-akụziri gị ihe.
Jụọkwa ụmụ nnụnụ, ha ga-akọrọ gị.
8 Ma ọ bụ, leruo ihe ndị dị n’ụwa anya.* Ha ga-akụziri gị ihe.
Azụ̀ ndị dị n’oké osimiri ga-akọkwara gị ya.
9 N’ime ihe ndị a niile, olee nke na-amaghị
Na ọ bụ aka Jehova mere ihe a?
12 Ọ̀ bụ na ndị agadi amaghị ihe?+
Ọ̀ bụ na ịdịte ndụ aka anaghị eme ka mmadụ na-aghọta ihe?
13 O nwere amamihe ma dị ike.+
Ọ na-aghọta ihe, na-emekwa ka uche ya mezuo.+
14 Ọ kwatuo ihe, e nweghị ike ịrụghachi ya.+
O mechie ihe, e nweghị mmadụ nwere ike imeghe ya.
15 O jichie mmiri, ihe niile akpọọ nkụ.+
O mee ka mmiri zowe, mmiri eju n’ụwa.+
16 O nwere ike, nweekwa ezigbo amamihe.+
Ọ bụ ya nwe onye na-eme mmehie nakwa onye na-eme ka mmadụ mehie.
20 Ọ na-eme ka ndị a tụkwasịrị obi na ha ga-adụ ndị mmadụ ọdụ ghara ịma ihe ha ga-ekwu.
Ọ na-eme ka ndị agadi gharazie inwe ezi uche.
22 Ọ na-eme ka a mata ihe ndị e zoro n’ọchịchịrị,+
Ọ na-emekwa ka ìhè nwuo n’ebe gbara oké ọchịchịrị.
23 Ọ na-eme ka mba dị iche iche dị ike, ka o wee bibie ha.
Ọ na-eme ka ala mba dị iche iche saa mbara, ka o wee mee ka a dọrọ ha n’agha.
24 Ọ na-eme ka ndị na-achị ndị mmadụ ghara ịghọta ihe,
Na-emekwa ka ha na-agagharị n’ọzara ụzọ na-adịghị.+
25 Ha na-asọ ìsì n’ọchịchịrị,+ n’ebe ìhè na-adịghị.
Ọ na-eme ka ha na-adagharị ka ndị mmanya na-egbu.+