Ezikiel
30 Jehova gwara m okwu ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma, sị, ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị:
“Bee ákwá arịrị, sị, ‘Ewoo, ụbọchị ahụ na-abịa!’
3 N’ihi na ụbọchị ahụ dị nso. N’eziokwu, ụbọchị Jehova dị nso.+
Ọ ga-abụ ụbọchị ígwé ojii+ na oge a ga-ekpe mba dị iche iche ikpe.+
4 A ga-eji mma agha mee ndị Ijipt ihe. Ndị Etiopia ga-achịrịkwa obi n’aka mgbe e gburu ndị mmadụ n’Ijipt.
A ga-eburu akụ̀ ndị Ijipt, kụtuokwa ntọala ha.+
5 A ga-eji mma agha gbuo
Ndị Etiopia,+ ndị Pọt,+ ndị Lọd, ndị niile si mba ndị ọzọ,
Ndị Kọb, nakwa ndị Izrel ha na ndị ọzọ gbara ndụ.”’*
6 Jehova kwuru, sị:
‘Ndị na-akwado Ijipt ga-ada.
A ga-anapụ Ijipt ike ya nke na-ebu ya isi.’+
“‘A ga-eji mma agha gbuo ndị Ijipt, malite na Migdọl+ ruo na Sayini.’+ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a. 7 ‘A ga-eme ka ala ha bụrụ ebe kacha njọ n’ala niile tọgbọ nkịtị. A ga-emekwa ka obodo ndị dị na ya bụrụ ebe kacha njọ n’obodo niile e bibiri ebibi.+ 8 Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m sunyere Ijipt ọkụ, bibiekwa ndị niile ha na ya dị ná mma. 9 N’ụbọchị ahụ, m ga-ezi ndị ga-eji ụgbọ mmiri gaa mee ka ndị Etiopia, bụ́ ndị tụkwasịrị onwe ha obi, maa jijiji. Obi ga-awụnyekwa ha n’afọ n’ụbọchị a ga-ebibi ndị Ijipt, n’ihi na ụbọchị ahụ ga-erurịrị.’
10 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-esi n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn kpochapụ ọtụtụ ndị n’Ijipt.+ 11 A ga-akpọta ya na ndị agha ya, bụ́ ndị obi kacha fee azụ ná mba niile,+ ka ha bịa laa Ijipt n’iyi. Ha ga-amịpụta mma agha ha lụso Ijipt agha. Ndị ha gburu ga-ejukwa ebe niile n’ala Ijipt.+ 12 M ga-eme ka iyi niile na-asọnye n’Osimiri Naịl taa.+ M ga-eresịkwa ndị ọjọọ ala Ijipt. M ga-eji ndị mba ọzọ mee ka ala ha na ihe niile dị n’ime ya tọgbọrọ nkịtị.+ Ọ bụ mụnwa, bụ́ Jehova, kwuru ihe a.’
13 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-ebibikwa arụsị ha dị iche iche na-asọ oyi,* bibiekwa chi dị iche iche na-abaghị uru ndị dị na Nọf.*+ A gaghịzi enwe onyeisi bụ́ onye Ijipt. M ga-emekwa ka ụjọ na-atụ ndị Ijipt.+ 14 M ga-eme ka Patrọs tọgbọrọ nkịtị.+ M ga-esunye Zoan ọkụ, meekwa Noo* ihe m kpebiri ime ya.+ 15 Sin bụ ebe a rụsiri ike n’Ijipt. M ga-eji ezigbo iwe mee ya ihe. M ga-ebibikwa ndị Noo. 16 M ga-esunye Ijipt ọkụ. Ezigbo ụjọ ga-ejide ndị Sin. A ga-akwatu mgbidi Noo. Ndị iro ndị Nọf* ga-alụso ha agha n’ehihie. 17 A ga-eji mma agha gbuo ụmụ okorobịa ndị Ọn* na ụmụ okorobịa ndị Paịbiset. A ga-adọrọkwa obodo ndị a n’agha. 18 Ụbọchị ga-agba ọchịchịrị na Tihafnihis mgbe m ga-agbaji osisi yok Ijipt n’ebe ahụ.+ A ga-anapụ ya ike ya nke na-ebu ya isi.+ Ígwé ojii ga-ekpuchi ya. A ga-adọrọkwa obodo niile dị na ya n’agha.+ 19 M ga-eme Ijipt ihe m kpebiri ime ya. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”
20 N’abalị asaa, n’ọnwa mbụ, n’afọ nke iri na otu,* Jehova gwara m, sị: 21 “Nwa nke mmadụ, agbajiela m aka Fero bụ́ eze Ijipt. A gaghị eke ya ákwà ma ọ bụ bandeeji ka ọ laa ma dị ike ijide mma agha.”
22 “N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: ‘M ga-emesi Fero eze Ijipt ike.+ M ga-agbaji aka ya, ma nke dị ike ma nke a gbajiri agbaji.+ M ga-emekwa ka mma agha o ji n’aka dapụ.+ 23 M mechaa ya ihe a, m ga-achụsasị ndị Ijipt ná mba dị iche iche, chụgakwa ha n’ala dị iche iche.+ 24 M ga-eme ka aka eze Babịlọn dị ike.*+ M ga-enyekwa ya mma agha m.+ M ga-agbaji aka Fero. Ọ ga-anọkwa n’ihu eze Babịlọn na-asụsi ude ike ka onye nọ n’ọnụ ọnwụ. 25 M ga-eme ka aka eze Babịlọn dị ike, ma, aka Fero ga-akụda. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova mgbe m ga-enye eze Babịlọn mma agha m, ya ejirikwa ya lụso ndị Ijipt agha.+ 26 M ga-achụsasị ndị Ijipt ná mba dị iche iche, chụgakwa ha n’ala dị iche iche.+ Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”