Ekliziastis
6 E nwere ihe ọzọ dị njọ* m hụrụla n’ụwa,* ọ na-emekarịkwa ndị mmadụ: 2 Ezi Chineke na-enye mmadụ akụnụba, meekwa ka a na-akwanyere ya ùgwù, nke mere na onye ahụ na-enweta ihe ọ bụla gụrụ ya. Ma ezi Chineke anaghị eme ka o nwee ike iri ya, kama onye ọzọ nwere ike iri ya. Ihe a bụ ihe efu, ọ jọgbukwara onwe ya. 3 Ọ bụrụ na mmadụ amụọ otu narị ụmụ, bie ndụ ọtụtụ afọ, kaakwa nká, ma o kporighị ndụ tupu ya abanye n’ili, m ga-asị na nwa nwụrụ n’ime afọ nne ya ka ya mma.+ 4 Ọmụmụ a mụrụ nwa ahụ bụ n’efu. Ọ dịkwa ka à ga-asị na ọ nwụrụ n’ọchịchịrị, o nweghịkwa aha. 5 Ọ bụ eziokwu na ọ hụghị anyanwụ, e nweghịkwa ihe ọ ma, ma ọ ka onye nke ọzọ mma.*+ 6 Olee uru ọ baara mmadụ na ọ dị ndụ ruo puku afọ abụọ (2,000), ma o kporighị ndụ? Ọ̀ bụ na ọ bụghị otu ebe ka mmadụ niile na-aga?+
7 Ọrụ niile mmadụ na-arụsi ike bụ ka ọ kpata ihe afọ ga-eri;+ ma afọ anaghị eju ya eju. 8 N’ihi na olee ihe onye ma ihe ji kara onye nzuzu mma?+ Ma ọ bụ, olee uru ọ bara na ogbenye ma otú ọ ga-esi na-edi nsogbu ndị na-abịara ya? 9 Ọ ka mma na mmadụ ji ihe ndị ọ na-ahụ anya na-eme onwe ya obi ụtọ kama ịchọgharịwa ihe na-agụ ya agụụ ọ na-enweghị ike inweta. Ihe a bụkwa ihe efu. Ọ bụ ịchụ ifufe.
10 A kpọbuola ihe ọ bụla dị adị aha. A matakwala ihe mmadụ bụ. Mmadụ enweghị ike ịrụ onye ka ya ike ụka. 11 Ekwurekwu na-eme ka mmadụ na-ekwu ihe na-enweghị isi.* Oleekwanụ uru ọ baara mmadụ? 12 Ònye ma ihe kacha mma mmadụ ga-eme n’ime ụbọchị ole na ole ọ ga-adị ndụ ya na-enweghị isi, nke na-agafe ngwa ngwa ka onyinyo?+ N’ihi na e nweghị onye nwere ike ịgwa mmadụ ihe ga-eme n’ụwa* mgbe ọ na-anọghịzi.