Joshụa
5 Ozugbo ndị eze Amọraịt+ niile bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan na ndị eze Kenan+ niile bi n’akụkụ oké osimiri nụrụ na Jehova mere ka mmiri Jọdan taa n’ihu ndị Izrel ruo mgbe ha gafechara, obi wụnyere ha n’afọ,*+ ha amaghịkwa ihe ha ga-eme eme* n’ihi ndị Izrel.+
2 N’oge ahụ, Jehova gwara Joshụa, sị: “Were nkume rụọ mma ma bie ndị Izrel úgwù.”*+ 3 N’ihi ya, Joshụa weere nkume rụọ mma ma bie ndị Izrel úgwù na Gibiat-haaralọt.*+ 4 Ihe mere Joshụa ji bie ha úgwù bụ na ụmụ nwoke niile ndị si n’Ijipt pụta, ya bụ, ụmụ nwoke niile na-aga agha,* nwụrụ n’ụzọ n’ala ịkpa mgbe ha si n’Ijipt na-apụta.+ 5 E biri ndị niile si n’Ijipt pụta úgwù, ma e bighị ndị niile a mụrụ n’ala ịkpa úgwù, ya bụ, ndị niile a mụrụ n’ụzọ mgbe ha si n’Ijipt na-apụta. 6 Ndị Izrel jegharịrị n’ala ịkpa afọ iri anọ,+ ruo mgbe ụmụ nwoke niile ndị na-aga agha, ndị si n’Ijipt pụta, ndị na-erubereghịkwa Jehova isi, nwụchara.+ Jehova ṅụrụ iyi na ya agaghị ekwe ka ha hụ ala ahụ+ Jehova ṅụụrụ ndị nna nna anyị iyi na ọ ga-enye anyị.+ Mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ala ahụ.*+ 7 Ụmụ ha nọchiziri ha.+ Ndị a ka Joshụa biri úgwù n’ihi na e bighị ha úgwù n’ụzọ.
8 Mgbe e bichara mba ahụ niile úgwù, ha nọgidere n’ebe ha mara ụlọikwuu ruo mgbe ọnyá ha lara.
9 Jehova wee sị Joshụa: “Emeela m ka ndị Ijipt kwụsị ịkọcha unu taa.”* A maliteziri ịkpọ ebe ahụ Gilgal*+ ruo taa.
10 Ndị Izrel nọgidere ebe ahụ ha mara ụlọikwuu na Gilgal. Ha nọkwa n’ọzara Jeriko mee Ememme Ngabiga n’anyasị abalị iri na anọ n’ọnwa ahụ.+ 11 N’ụbọchị na-eso Ememme Ngabiga ahụ, ha malitere iri ihe ala ahụ mepụtara. Ha tara achịcha na-ekoghị eko+ na ọka* e ghere eghe* n’otu ụbọchị ahụ. 12 Mana kwụsịkwara ịda n’ụbọchị na-eso ụbọchị ha riri ihe ala ahụ mepụtara. Ọ daraghị ndị Izrel ọzọ.+ N’afọ ahụ ka ha maliteziri riwe ihe ala Kenan mepụtara.+
13 Otu ụbọchị mgbe Joshụa nọ Jeriko nso, o leliri anya hụ otu nwoke+ guzo n’ihu ya. Nwoke ahụ ji mma agha ọ mịpụtara n’ọbọ ya.+ Joshụa gakwuuru ya, sị ya: “Ị̀ na-akwado anyị, ka ị̀ na-akwado ndị iro anyị?” 14 Nwoke ahụ asị ya: “Abụ m* ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova.”+ Joshụa wee gbuo ikpere n’ala, kpọọ isiala, sị ya: “Gịnị ka onyenwe m chọrọ ịgwa ohu ya?” 15 Ọchịagha nke ụsụụ ndị agha Jehova wee sị Joshụa: “Yipụ akpụkpọ ụkwụ gị, n’ihi na ebe i guzo dị nsọ.” Joshụa wee yipụ ya ozugbo.+