Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Mbụ NDỊ EZE NKE MBỤ IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Devid na Abishag (1-4) Adọnaịja nwara iweghara ọchịchị (5-10) Netan na Bat-shiba kụghasịrị atụmatụ Adọnaịja (11-27) Devid kwuru ka e tee Solomọn mmanụ (28-40) Adọnaịja gbagara n’ebe ịchụàjà (41-53) 2 Devid gwara Solomọn ihe ndị ọ ga-eme (1-9) Devid nwụrụ, Solomọn achịwazie (10-12) Nkata Adọnaịja kpara tara isi ya (13-25) A chụpụrụ Abayata, gbuo Joab (26-35) E gburu Shimiaị (36-46) 3 Solomọn lụrụ nwa Fero (1-3) Jehova mere ka Solomọn hụ ya ná nrọ (4-15) Solomọn rịọrọ Chineke ka o nye ya amamihe (7-9) Solomọn kpeere ụmụ nwaanyị abụọ na-azọ nwa ikpe (16-28) 4 Ndị na-enyere Solomọn aka n’ọchịchị (1-19) Ihe na-agaziri ndị mmadụ mgbe Solomọn na-achị (20-28) Obi ruru onye ọ bụla ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya (25) Amamihe Solomọn na ilu ndị ọ tụrụ (29-34) 5 Eze Haịram buteere Solomọn ihe ndị ọ ga-eji arụ ụlọ (1-12) Ndị Solomọn kpọọrọ ka ha na-arụrụ ya ọrụ (13-18) 6 Solomọn rụrụ ụlọ nsọ (1-38) Ọnụ ụlọ dị n’ime ime (19-22) Cherob abụọ (23-28) Ihe ndị a tụrụ atụ, ibo ụzọ abụọ, na ogige dị n’ime (29-36) E ji ihe dị ka afọ asaa rụchaa ụlọ nsọ (37, 38) 7 Obí Solomọn (1-12) Haịram ji ezigbo nkà o nwere nyere Solomọn aka (13-47) Ogidi ọla kọpa abụọ (15-22) Nnukwu efere a na-akpọ Oké Osimiri (23-26) Ihe iri e ji ebu ihe na efere iri e ji ọla kọpa rụọ (27-39) A rụchara ihe niile e ji ọlaedo na-arụ (48-51) 8 E bubatara igbe ọgbụgba ndụ n’ụlọ nsọ (1-13) Solomọn gwara ndị Izrel okwu (14-21) Ekpere Solomọn kpere iji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (22-53) Solomọn gọziri ndị Izrel (54-61) A chụrụ àjà, meekwa ememme e ji nyefee Chineke ụlọ nsọ ya (62-66) 9 Jehova mere ka Solomọn hụ ya ọzọ ná nrọ (1-9) Onyinye Solomọn nyere Eze Haịram (10-14) Ihe dị iche iche Solomọn rụrụ (15-28) 10 Eze nwaanyị Shiba gara na nke Solomọn (1-13) Akụnụba Solomọn enweghị atụ (14-29) 11 Ndị nwunye Solomọn mere ka obi ya pụọ n’ife Chineke (1-13) Ndị iro Solomọn (14-25) E kwere Jeroboam nkwa na ọ ga-achị ebo iri n’Izrel (26-40) Solomọn nwụrụ, Rehoboam achịwazie (41-43) 12 Rehoboam gwara ndị Izrel okwu ọjọọ (1-15) Ebo iri nupụụrụ Rehoboam isi (16-19) E chiri Jeroboam eze Izrel (20) A gwara Rehoboam ka ọ ghara ịlụso ndị Izrel agha (21-24) Jeroboam kpụrụ nwa ehi ọlaedo a na-efe ofufe (25-33) 13 E buru amụma ihe ga-eme ebe ịchụàjà dị na Betel (1-10) Ebe ịchụàjà ahụ gbawara (5) Onye nke Chineke nupụrụ isi (11-34) 14 Ahaịja buru amụma ihe ga-eme Jeroboam (1-20) Rehoboam nọ na-achị Juda (21-31) Shaịshak bịara lụso Jeruselem agha (25, 26) 15 Abaịjam malitere ịchị Juda (1-8) Esa malitere ịchị Juda (9-24) Nedab malitere ịchị Izrel (25-32) Beasha malitere ịchị Izrel (33, 34) 16 Jehova kwuru ihe ga-eme Beasha (1-7) Ịla malitere ịchị Izrel (8-14) Zimraị malitere ịchị Izrel (15-20) Ọmraị malitere ịchị Izrel (21-28) Ehab malitere ịchị Izrel (29-33) Hayel rụsiri Jeriko ike (34) 17 Ịlaịja buru amụma na mmiri agaghị ezo n’Izrel (1) Ugoloọma nọ na-ewetara Ịlaịja nri (2-7) Ịlaịja gara na nke otu nwaanyị isi mkpe na Zarefat (8-16) Nwa otu nwaanyị isi mkpe nwụrụ, a kpọlite ya n’ọnwụ (17-24) 18 Ịlaịja gara hụ Obedaya na Ehab (1-18) Ịlaịja na ndị amụma Bel gara n’ugwu Kamel (19-40) “Olee mgbe unu ga-akwụsị ịkwụ ụzọ ebe abụọ?” (21) Afọ atọ na ọkara mmiri na-ezoghị gafere (41-46) 19 Ịlaịja gbara ọsọ ndụ ka Jezibel ghara igbu ya (1-8) Jehova mere ka Ịlaịja hụ ya n’ugwu Horeb (9-14) Ịlaịja ga-ete Hazel, Jihu, na Ịlaịsha mmanụ (15-18) A họpụtara Ịlaịsha ka ọ nọchie Ịlaịja (19-21) 20 Ndị Siria gara lụso Ehab agha (1-12) Ehab meriri ndị Siria (13-34) E buru ihe ga-eme Ehab n’amụma (35-43) 21 Ehab chọrọ ịnara Nebọt ubi vaịn ya (1-4) Jezibel kpara nkata, e gbuo Nebọt (5-16) Ịlaịja kwuru ihe ga-eme Ehab (17-26) Ehab wedara onwe ya ala (27-29) 22 Jehoshafat na Ehab jikọrọ aka na-eme ihe (1-12) Mịkaya buru amụma na a ga-emeri Ehab n’agha (13-28) Otu mmụọ ozi ga-eme ka ndị amụma ghaara Ehab ụgha, rafuo ya (21, 22) E gburu Ehab na Remọt-gilied (29-40) Otú ihe dị mgbe Jehoshafat na-achị Juda (41-50) Ehazaya malitere ịchị Izrel (51-53)