Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Emọs EMỌS IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Jehova gwara Emọs ihe ọ ga-ebu n’amụma (1, 2) Obodo ndị a ga-ata ahụhụ maka isi ha nupụụrụ Jehova ugboro ugboro (3-15) Siria (3-5), Filistia (6-8), Taya (9, 10), Ịdọm (11, 12), Amọn (13-15) 2 Obodo ndị a ga-ata ahụhụ maka isi ha nupụụrụ Jehova ugboro ugboro (1-16) Moab (1-3), Juda (4, 5), Izrel (6-16) 3 Emọs gwara ndị Izrel ihe Chineke ga-eme ha (1-8) Chineke na-eme ka ndị amụma ya mata ihe ọ na-achọghị ka ndị ọzọ mata (7) Ahụhụ Chineke ga-ata Sameria (9-15) 4 Ahụhụ a ga-ata ụmụ nwaanyị ndị dị ka ehi Beshan (1-3) Jehova kwara ndị Izrel emo maka na ha na-efe arụsị (4, 5) Ndị Izrel ekweghị alọghachikwute Jehova (6-13) “Jikere ka gị na Chineke gị hụ” (12) ‘Chineke na-agwa ụmụ mmadụ ihe dị ya n’obi’ (13) 5 Izrel adaala (1-3) Chọọnụ Chineke ka unu wee dịrị ndụ (4-17) Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya (15) Ụbọchị Jehova ga-abụ ụbọchị ọchịchịrị (18-27) Jehova anabataghị àjà ndị Izrel nọ na-achụrụ ya (22) 6 Ndị tụkwasịrị onwe ha obi ga-ata ahụhụ (1-14) Àkwà ndị e ji ọdụ́ rụọ na efere ndị e ji aṅụ mmanya (4, 6) 7 Ọhụụ ndị gosiri na oge a ga-ebibi Izrel adịla nso (1-9) Igurube (1-3), ọkụ (4-6), eriri e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ (7-9) Amazaya gwara Emọs ka ọ kwụsị ibu amụma na Sameria (10-17) 8 Ọhụụ Emọs hụrụ gbasara nkata mkpụrụ osisi mịrị n’oge ọkọchị (1-3) Jehova mara ndị na-azọgbu ụmụ ogbenye ikpe (4-14) A ga-enwe agụụ ịnụ okwu Chineke (11) 9 O nweghị onye ga-agbanahụli ikpe Chineke (1-10) Jehova ga-ebuli ụlọ ndò Devid elu (11-15)