Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Maịka MAỊKA IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Ihe Chineke ga-eme Sameria na Juda (1-16) Ihe kpataara ha nsogbu bụ mmehie ha na isi ha nupụrụ (5) 2 A ga-ata ndị na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ (1-11) A kpọkọtara ndị Izrel ka ha dịrị n’otu (12, 13) Ìgwè mmadụ ga na-eme mkpọtụ n’Izrel (12) 3 Chineke katọrọ ndị ndú Izrel na ndị amụma (1-12) Mmụọ Jehova mere ka Maịka nwee ezigbo ike (8) Ndị nchụàjà na-ezi ihe iji nweta ego (11) Jeruselem ga-abụzi obodo e bibiri ebibi (12) 4 E buliri ugwu Jehova elu (1-5) Mma agha ga-abụzi mma ogè (3) ‘Anyị ga na-aza aha Jehova’ (5) Zayọn ga-esi ike ma ọ maliteghachi ịchị (6-13) 5 Otu onye ọchịchị ga-abụ onye ukwu n’ụwa niile (1-6) Onye ọchịchị ga-esi na Betlehem pụta (2) Ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Jekọb ga-adị ka igirigi, dịkwa ka ọdụm (7-9) A ga-eme ka ala Izrel dị ọcha (10-15) 6 Ihe Jehova kwuru na ndị Izrel mere ya (1-5) Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka anyị? (6-8) Ikpe ziri ezi, ịbụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, ịdị umeala n’obi (8) Mmehie ndị Izrel mere na ahụhụ a ga-ata ha (9-16) 7 Ọtụtụ ihe ọjọọ ndị Izrel mere (1-6) Ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya (6) “M ga-echere Chineke” (7) Chineke kpepụtara ndị ya (8-13) Maịka rịọrọ Chineke arịrịọ, tookwa ya (14-20) Ihe Jehova zara Maịka (15-17) ‘Olee Chi dị ka Jehova?’ (18)