Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Zekaraya ZEKARAYA IHE NDỊ DỊ N’AKWỤKWỌ A 1 Jehova gwara ndị ya ka ha lọghachikwute ya (1-6) ‘Lọghachikwutenụ m, m ga-alọghachikwute unu’ (3) Ọhụụ nke Mbụ: Ndị na-agba ịnyịnya n’ebe e nwere osisi metụl (7-17) “Jehova ga-akasi Zayọn obi ọzọ” (17) Ọhụụ nke Abụọ: Mpi anọ na ndị omenkà anọ (18-21) 2 Ọhụụ nke Atọ: Nwoke ji ụdọ e ji atụ̀ ihe (1-13) A ga-atụ Jeruselem atụ̀ (2) Jehova ga-abụ “mgbidi ọkụ gburugburu” (5) Imetụ mkpụrụ anya Chineke aka (8) Ọtụtụ mba ga-esonyere Jehova (11) 3 Ọhụụ nke Anọ: E yiwere nnukwu onye nchụàjà uwe dị mma (1-10) Setan megidere Joshụa, nnukwu onye nchụàjà (1) ‘M ga-akpọbata ohu m bụ́ Ome’ (8) 4 Ọhụụ nke Ise: Ihe e ji adọsa ọkụ na osisi oliv abụọ (1-14) ‘Ọ bụghị ike mmadụ, kama ọ bụ mmụọ m ga-eme ha’ (6) Eledala ụbọchị ihe ji nke nta nke nta malite anya (10) 5 Ọhụụ nke Isii: Akwụkwọ mpịakọta na-efe efe (1-4) Ọhụụ nke Asaa: Ihe e ji atụ̀ ihe (5-11) Aha nwaanyị nọ n’ime ya bụ Ajọ Omume (8) E bugara ihe ahụ e ji atụ̀ ihe n’ala Shaịna (9-11) 6 Ọhụụ nke Asatọ: Ụgbọ ịnyịnya anọ (1-8) Ome ahụ ga-abụ eze na onye nchụàjà (9-15) 7 Jehova anabataghị ibu ọnụ na-esighị ndị ya n’obi (1-14) ‘Ọ̀ bụ m ka unu buuru ọnụ n’eziokwu?’ (5) ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi, na-ahụnụ ibe unu n’anya, na-emerenụ ibe unu ebere’ (9) 8 Jehova ga-eme ka eziokwu na udo dịrị na Zayọn (1-23) Jeruselem bụ “obodo eziokwu” (3) “Na-agwanụ ibe unu eziokwu” (16) Oge ibu ọnụ ga-abụzi oge ememme (18, 19) ‘Ka anyị jiri obi anyị niile chọọ Jehova’ (21) Mmadụ iri ga-ejide uwe onye Juu (23) 9 Ihe Chineke kpebiri ime mba ndị gbara Juda gburugburu (1-8) Eze Zayọn na-abịa (9, 10 Eze dị umeala n’obi nọ n’elu jakị (9) A ga-akpọpụta ndị Jehova a tụrụ mkpọrọ (11-17) 10 Rịọnụ Jehova ka o mee ka mmiri zoo (1, 2) Jehova ga-eme ka ndị ya dị n’otu (3-12) E si n’ụlọ Juda nweta onyeisi (3, 4) 11 Ahụhụ ndị hapụrụ onye ọzụzụ atụrụ Chineke họpụtara ga-ata (1-17) ‘Lekọtanụ atụrụ ndị a chọrọ igbu egbu’ (4) Mkpara abụọ: Ịdị Mma na Ịdị n’Otu (7) Ụgwọ ọrụ onye ọzụzụ atụrụ: mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ (12) A wụsara ego ahụ n’ebe a na-edowe akụ̀ (13) 12 Jehova ga-echebe Juda na Jeruselem (1-9) Jeruselem bụ “nkume dị arọ” (3) A ga-ebere onye a mara ube ákwá arịrị (10-14) 13 A ga-ewepụ arụsị niile na ndị amụma ụgha (1-6) Ihere ga-eme ndị amụma ụgha (4-6) A ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ (7-9) A ga-anụcha otu ụzọ n’ime ụzọ atọ (9) 14 Mmadụ niile ga-efewe ezi Chineke (1-21) Ugwu Oliv ga-agbawa abụọ (9) Jehova ga-abụ otu, nweekwa otu aha (9) A ga-eme ka ndị iro Jeruselem rịa ọrịa ọjọọ (12-15) A ga-eme Ememme Ụlọ Ndò (16-19) Ite ọ bụla ga-abụrụ Jehova ihe dị nsọ (20, 21)