Mgbe Nna Ya Ochie Nwụrụ
Otu onye bụ nne nke si Virginia Beach, Virginia, detara akwụkwọ ná mmalite afọ a, sị: “N’ọnwa gara aga, nna m nwụrụ. Ya na nwa m nwoke nke kasị dịrị nta bụ nnọọ ezi enyi, n’agbanyeghị na ha nọ ebe dị anya otu onye site n’ibe ya. Mgbe a gwara ya na nna ya ochie anwụwo, ọ malitere ịkwa ákwá n’ụzọ dị mwute.
“Emere m ngwa ngwa wee chọta traktị ahụ bụ Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? Ozugbo m chọtara ya, mgbe anya mmiri ka dị ya n’anya, amalitere m ịgụrụ ya akwụkwọ ahụ. Mgbe m gụsịrị, ahụ adajụwo ya nke ukwuu karị. Unu emeela maka iwepụta ihe ọmụma bara uru otú a, nke na-enye nnọọ aka n’oge ihe mgbu dị otú a.”
Ị pụrụ inweta trakti nke a na-akasi obi, tinyere ndị ọzọ, nanị site n’ideju ma zite mpempe akwụkwọ dị n’okpuru ebe a.
Ọ ga-amasị m ịnata traktị ahụ bụ Olileanya Dị Aṅaa Dịịrị Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ? na ndị ọzọ. (Degara adres dị n’okpuru ebe a akwụkwọ iji matakwuo ihe banyere nke a.)