Ha Dọọrọ Mmasị Ya
Na May 1995, otu nwanyị na New York City degaara isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Brooklyn, New York, akwụkwọ. Ọ kọwara, sị:
“Eji m ụkwụ na-agbada na East 124th St., n’agbata First na Second Avenue. Ọ dabara na m leruru anya ala, ifufe na-ekusasịkwa traktị ụfọdụ. Etukwuuru m ala ma tụtụrụ atọ n’ime traktị unu, Nkasi Obi Maka Ndị Dara Mbà n’Obi, Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ, na Ònye n’Ezie Na-achị Ụwa? Agụrụ m ha, ha masịkwara m nke ukwuu.
“Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na unu ga-enwe nnọọ obi ọma ma zitere m ihe ọmụma ụfọdụ banyere usoro ọmụmụ Bible ebe obibi a na-enye n’efu. Ọzọ, ọ bụrụ na o kwere omume, ọ ga-amasị m ịnata ụfọdụ n’ime akwụkwọ unu. Nye m, ọ bụ ngọzi na ezi Onyenwe anyị wụsara traktị atọ n’ụzọ m si agafe ka m wee chọta ha. Onyenwe anyị na-arụ ọrụ n’ụzọ ndị dị ịtụnanya.”
Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịgụ traktị ndị a na-akpali mmasị ma ọ bụ nwee ọmụmụ Bible ebe obibi, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.