Emefusịla, Anọla n’Ụkọ
N’ỌHA mmadụ na-azụ ihe nke oge anyị a, ntụfu nke ihe mkpofu na ihe ntụfu ndị ọzọ dị ize ndụ aghọwo nrọ ọjọọ. N’ụzọ dị iche, ihe okike Chineke bụ ihe ijuanya nke nchekwa na mmegharị ihe. Were, dị ka ihe atụ, ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Wax aṅụ, bụ́ ihe e ji ewu ọgba mmanụ aṅụ, bụ ihe dị oké ọnụ ahịa—aṅụ ga-achọ gram 16 nke mmanụ aṅụ na ntụ okooko osisi a na-amaghị ọ̀tụ̀tụ̀ ya iji mee nanị otu gram nke wax aṅụ. Olee otú aṅụ ndị ahụ si eme atụmatụ wax aṅụ ha? “Mgbidi atọ nke ụgbụgbọ mmanụ aṅụ e ji wax wuo na-abịakọta ọnụ n’otu ebe n’akụkụ dị 120 degree, na-eme ka e nwee ọtụtụ nkewa nwere akụkụ isii,” ka akwụkwọ bụ́ By Nature’s Design na-akọwa. “Ụkpụrụ a na-eme ka aṅụ belata ọ̀tụ̀tụ̀ wax ha ji eme ihe, ma na-emepụta ihe owuwu siri ike ebe ha ga-echekwa mmanụ aṅụ.” Ya mere otu ihe owuwu e ji ọgụgụ isi wuo na-ejikọta ịma mma nke ọdịdị na ịrụ ọrụ n’emefusịghị ihe, a pụkwara imegharị ya!
Ọ bụrụ na ọ na-amasị gị ịgụ isiokwu ndị bụ banyere sayensị na ihe ijuanya nke ihe e kere eke, ọ bụrụkwa na ọ ga-amasị gị ịdị na-anata Teta! mgbe nile, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova n’ógbè gị ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres dịkarịsịrị gị nso e depụtara na peji nke 5.