Nsogbu Ịkwọ Aka
OTU isiokwu pụtara na nso nso a n’akwụkwọ akụkọ ahụ ike nke France bụ́ Le Quotidien du Médecin mere ka ụzọ ndụ na-akpata nchegbu nke yiri ka ọ na-amụba amụba pụta ìhè—mmadụ akwọghị aka ya tupu o rie ihe na mgbe o jesịrị mposi. Dị ka Dr. Frédéric Saldmann si kwuo, adịghị ọcha onwe onye nke a dị mfe bụ ihe ize ndụ ihe oriri gbara ọkpụrụkpụ, o yikwara ka ọ ga-abụ nsogbu gbasapụrụ agbasapụ. Isiokwu ahụ na-ehota otu ihe ọmụmụ nke a chọpụtara na mamịrị nke mmadụ 12 dị iche iche dị n’efere ahụekere ndị dị n’ụlọ nri dị n’England. Ihe ọmụmụ ọzọ n’ụlọ akwụkwọ ndị America kpughere na ịkwọ aka n’ụzọ chiri anya nke onye nkụzi hụrụ na a kwọrọ ji 51 pasent belata ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka na-abịaghị akwụkwọ n’ihi nsogbu afọ na 23 pasent nke ndị na-abịaghị n’ihi nsogbu iku ume. Isiokwu ahụ mechiri site n’imesi ike mkpa nke ịkụziri ụmụaka ụkpụrụ nduzi ndị dị otú ahụ bụ isi nke ịdị ọcha site na nwa ọhụrụ.