Olileanya nke Otu Nwa Agbọghọ Onye Russia
OTU nwa agbọghọ dị afọ 15 bi n’Ukhta, Russia, bụ́ obodo ukwu nke ụba mmadụ ya karịrị 100,000, nke dị ihe karịrị kilomita 1,200 gaa n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ugwu Moscow, kwupụtara ọchịchọ siri ike maka ọnọdụ ka mma n’ụwa. Ọ kọwara nke a n’akwụkwọ ozi na-esonụ o degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia:
“Enyi m gwara m na akwụkwọ ahụ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ na-akọwa ndụ nke Jisọs Kraịst. Enwere m nnọọ mmasị n’akwụkwọ, magazin, na broshuọ unu. Ka m kọwaa otú mmasị a si tolite. Ọ malitere n’ọfịs telegraph mgbe m gara ịkwụ ụgwọ redio na telifon. N’ebe ahụ m hụrụ otu traktị n’ala ụlọ. Atụtụlitere m ya, kụchapụkwa ájá dị na ya, ma malite ịgụ traktị ahụ, bụ́ nke a kpọrọ N’ihi Gịnị Ka Ndụ Ji Jupụta Nnọọ ná Nsogbu?
“Agụrụ m banyere nsogbu na nhụjuanya ndị mmadụ na-enwe, ihu traktị ahụ nwekwara ihe osise nke nkwa maka ndụ ọhụrụ n’ime Paradaịs. Enwere m olileanya na otu ụbọchị ọ ga-abịa. Achọrọ m n’ezie ịhụ ka mmadụ nile nwere obi ụtọ, afọ ojuju, na ahụ ike nakwa ịhụ ndị ikwu nwụrụ anwụ. . . . M ga-achọ ịmata ihe m kwesịrị ime iji nweta olileanya nke ibi na Paradaịs elu ala ahụ. M na-arịọ unu ka unu zitere m ụfọdụ ihe ọmụma ma ọ bụ akwụkwọ. M ga-akwụ ụgwọ ha na ụgwọ nzite ha.”
Gị onwe gị kwa pụrụ inweta akwụkwọ nke pụrụ inyere gị aka inweta olileanya siri ike dabeere na Bible maka ndụ n’elu ụwa paradaịs. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịma otú ị ga-esi nweta otu broshuọ ahụ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ chọọ ka mmadụ kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5.