Ihe E Ji Amata Ezi Iso Ụzọ Kraịst
EZIGBO ile ọbịa, nke sitere n’obi, bụ ihe e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst. Mgbe mwụpụ nke mmụọ nsọ n’ụbọchị Pentikọst, 33 O.A. gasịrị, ọtụtụ ndị Kraịst a tọghatara ọhụrụ nọgidere na Jerusalem iji mụtakwuo ihe banyere ozi ọma nke Alaeze ahụ tupu ha alawa n’ebe obibi ha n’akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ndị Kraịst bi na Jerusalem, bụ́ ndị nabatara ha n’ebe obibi ha, ọbụna reekwa ihe onwunwe ha ma were ihe nile dị ka ihe e nwekọrọ ọnụ, lere ha ọbịa. (Ọrụ 2:42-46) Ndị ozi mesịrị mee ndokwa a haziri ahazi maka ikesara ndị inyom di ha nwụrụ nọ ná mkpa n’etiti ha ihe oriri.—Ọrụ 6:1-6.
Ile ọbịa bụ ihe a chọrọ n’aka ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na ọtụtụ enwewo mkpagbu siri ike, ụfọdụ abụrụwokwa ndị a kwakọọrọ ihe onwunwe ha, Pọl nyere iwu, sị: “Unu echezọla ile ndị ọbịa nke ọma.” (Ndị Hibru 13:2; 10:34) Pita gosiri na e kwesịrị iji ọchịchọ obi mee ya, na-ekwu, sị: “Na-elerịta onwe unu ọbịa nke ọma n’atamughị ntamu.” (1 Pita 4:9; tụlee 2 Ndị Kọrint 9:7.) N’imesi ibu ọrụ ha ka mkpa n’ebe ndị kwere ekwe ibe ha nọ ike, Pọl dere na ndị so bụrụ ndị Kraịst ga “na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma . . . karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.”—Ndị Galetia 6:10.
Ile ọbịa bụ otu n’ime àgwà ndị dị mkpa a chọrọ n’aka ndị a ga-ahọpụta dị ka ndị nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst. (1 Timoti 3:2; Taịtọs 1:7, 8) Ọzọkwa, Pọl nyere Timoti, bụ́ onye nlekọta n’Efesọs ntụziaka, na ndị inyom di ha nwụrụ bụ́ ndị Kraịst e debanyere aha ha n’akwụkwọ maka inweta enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe site n’ọgbakọ kwesịrị ịbụ ndị ‘leworo ndị ọbịa anya nke ọma.’ (1 Timoti 5:9, 10) Ihe àmà na-egosi na ndị inyom ndị a ewepụtawo ụlọ ha maka ndị Kraịst na-eje ozi ma ọ bụ ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị letara ọgbakọ ha, ọ bụ ezie na tupu nke a ọtụtụ n’ime ndị ọbịa ndị a gaara abụworị “ndị ọbịa” n’ebe ha nọ. Lidia bụ nwanyị dị otú ahụ. Ọ na-ele ọbịa n’ụzọ pụrụ iche, Luk na-akọ, sị: “O wee rụgide anyị.”—Ọrụ 16:14, 15.