Ịtụleghachi Akụkọ Ọjọọ nke Ịgba Ohu
ÎLE DE GORÉE dị nnọọ ná mpụga nke ụsọ oké osimiri mba Africa bụ́ Senegal, na nso obodo Dakar. Ruo afọ 312, rute n’afọ 1848, àgwàetiti a bụ ebe ịzụ ahịa ohu na-aga nke ọma. Ihe ndekọ mgbe ochie ndị e nwetara n’ọdụ ụgbọ mmiri Nantes nke France na-egosi na n’agbata afọ 1763 na afọ 1775 nanị, a zụụrụ ihe karịrị ndị ohu 103,000 site na Gorée gafere ọdụ ụgbọ mmiri Nantes.
Taa nkezi nke ndị nleta 200 na-eleta Maison des Esclaves, bụ́ Ụlọ Ndị Ohu nke bụ́ ebe ndebe ihe mgbe ochie, kwa ụbọchị. Onye na-edugharị ndị nleta bụ́ Joseph Ndiaye kọrọ ụfọdụ n’ime nhụsianya nke ndị ahụ na-enweghị ike ime ihe ọ bụla hụsiri: “E buuru ndị nna nna anyị hà gaa mba ọzọ, kewaa ezinụlọ ha, jiri ígwè ọkụ kanye ha akara n’ahụ, dị ka ehi.” A kpụkọọrọ ezinụlọ dum n’agbụ rute n’ebe a. “Nne ha nwere ike gaa America, nna ha agaa Brazil, ụmụ ha agaa Antilles,” ka onye nduzi ahụ kọrọ.
“Mgbe a tụsịrị ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀,” ka Ndiaye kọwara, “a na-eji afọ ndụ na ebe ha si amara ihe ndị nwoke ruru, ebe a na-ewere ndị si n’agbụrụ ụfọdụ dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa n’ihi ịgbasi ike ha ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị e weere dị ka ndị na-amụ ụmụ hie nne. Dị ka ihe atụ, a na-ewere ndị Yoruba dị ka ndị dị oké ọnụ ahịa n’ihi ‘ikike ha ịmụ ọtụtụ ụmụ.’”
A na-eme ka ndị e ji eji na-enweghị ume otú a chọrọ buo ibu dị ka ọkụkọ bekee tupu e ree ha ná mgbuka. Ndị na-azụ ahịa ohu na-ahọrọ ụmụ agbọghọ ndị ha ga-eji gboo ọchịchọ mmekọahụ ha kwa abalị. A na-akwụgbu ndị ohu na-enupụ isi site n’ikedo ha eriri na ǹgụ̀ kama ikedo ha n’olu, iji mee ka oké ihe mgbu ha dịtee aka.
Popu John Paul nke Abụọ gara leta Gorée na 1992. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kọrọ na “ọ rịọrọ mgbaghara maka ahịa ohu ahụ, na-arịọ mgbaghara n’isi ndị nile keere òkè na ya, gụnyere ndị ozi ala ọzọ nke Katọlik bụ́ ndị nakwerewooro ịgba ndị Africa n’ohu dị ka akụkụ nke ihe dị otú o kwesịrị.”
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile dị njikere ikweta ihe merenụ. Afọ abụọ na ọkara gara aga, tupu e gwupụta ihe ndekọ nke Nantes ahụ, onye France bụ́ onye Jesuit kwusiri ike na ọ bụ nanị ndị ohu 200 ruo 500 n’otu afọ ka e rere na Gorée. Ruo ugbu a, ka Maazị Ndiaye kwuru, “ụwa anakwerebeghị ịdị ukwuu nke ihe ọjọọ a.”
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 30]
Gianni Dagli Orti/Corbis
Yann Arthus- Bertrand/Corbis
E sitere na DESPOTISM—A Pictorial History of Tyranny sepụtaghachi ya