Penny Pụrụ Iche nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Sierra Leone
Ị̀ HỤTỤWO ego dị otú a? Ọ bụ penny ndị Kissi. E debere ụfọdụ n’ime mkpụrụ ego ndị a n’Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Mba Sierra Leone, dị na Freetown. Kaadị e dere ihe banyere ya na-ekwu, sị: “Ụdị ego a na-adọrọ mmasị si ma Sierra Leone ma Liberia. E jiri ya mee ihe n’ógbè ndị ahụ laarị azụ n’afọ 1945. Ebe ọ bụ ihe nnọchianya nke isi (isi gbara ya okirikiri) na ụkwụ (ọdụ ya kapịrị ọnụ) a sịrị na ọ bụ ego nwere mmụọ. Mgbe onye eze nwụrụ, a ga-agbaji ọtụtụ ma rụnye ha n’ili ya. Ọnụ ahịa ikpeazụ e jiri gbanweta ya a rịbara ama bụ Kissi 50 maka otu Shilling nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa.”
Dị ka akwụkwọ bụ́ The African Slave Trade, nke Basil Davidson dere, si kwuo, ogologo oge gara aga e jiri “ígwè ndị dị ogologo” zụta ndị ohu. Hà bụ penny ndị Kissi? Ụfọdụ ndị ọkachamara kwere na ha bụ. Ndị ọzọ ekwetaghị. Ma, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na e jighị mkpụrụ ego ndị a gbata ndị ohu, n’ezie e jiri ha lụọ nwanyị.
Dị ka e gosiri n’elu, mgbe ụfọdụ e jiri mkpụrụ ego ndị a mee ihe n’ụzọ okpukpe, karịsịa n’ihe banyere nkwenkwe nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Mgbe mmadụ nwụrụ, e weere ya na o kwesịrị ekwesị ili ya n’obodo a mụrụ ya. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ nọ n’ebe dị anya nwụọ, ọ naghị adị mfe mgbe nile ibula ozu ahụ ụlọ. Ihe a ga-eme ya bụ iji penny ndị Kissi bulaa mkpụrụ obi ya.
Onye ikwu nke onye ahụ nwụrụ anwụ ga-aga n’obodo nta onye ahụ nọ nwụọ ma nata onye dibịa otu penny, bụ́ onye, dị ka e si chee, ga-etinye mkpụrụ obi onye ahụ nwụrụ anwụ na ya site n’ịgba afa. Ọ bụzi ọrụ onye ikwu ahụ ibula mkpụrụ obi ahụ (penny ahụ) ụlọ ma lie ya n’ili ndị nna nna ha.
Onye ikwu ahụ ga-eji ákwà dị ọcha kee penny ahụ ma malite njem ya, nke ọ ga-eme n’ekwughị okwu. E kwere na ọ bụrụ na o kwusara mmadụ okwu n’ụzọ, mkpụrụ obi ahụ ga-esi na penny ahụ pụọ ma laghachi n’obodo nta ahụ onye ahụ nọ nwụọ. N’ihi ya onye ikwu ahụ aghaghị ịgaghachi jee nata ya ọzọ—ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ ga-abụ mgbe ọ kwụsịrị onye dibịa ahụ ụgwọ ọzọ!
Ọ bụrụ na ọ dị ya mkpa ikwu okwu mgbe ọ nọ na njem ahụ, onye ikwu ahụ pụrụ ime otú ahụ ma ọ bụrụ na o jiri nwayọọ dotuo penny ahụ, ma ọ gaghị abụ n’ala, tupu o kwuwe okwu. Ozugbo o welitere penny ahụ ọzọ, ọ ghaghị idebe iwu ịghara ikwu okwu.
N’ịbụ nke dị sentimita 33 ruo 36 n’ogologo, penny Kissi adịghị mma itinye n’akpa ma ọ bụ na pọọsụ. Otú ọ dị, ọdịdị ha kwesịrị oge ha, ebe a pụrụ iji eriri kekọta ha n’ụzọ dị mfe ma buru ha n’isi. Ndị bara ọgaranya na-edebe penny ndị a n’ụlọ elu ha. Mgbe ihu igwe dị mma, a ga-enwe mkpụrụ mmiri n’ego ahụ, ha ga-atasa n’ime ụlọ dị n’ala. Ókè “mmiri tapụtaranụ” hà bụ ihe àmà nke ókè àkụ̀ na ụba nke onye ị nọ n’ụlọ ya hà.