Olee Otú E Kwesịrị Isi Nyiwe Nwa Ọhụrụ?
N’ỤWA nile ọtụtụ ụmụ ọhụrụ anwụwo n’ihi Ọnwụ Mberede Ụmụaka (SIDS). Na United States, ọ bụ ihe kasị akpata ọnwụ ụmụ ọhụrụ dị malite n’otu ọnwa ruo ọnwa 12. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a ga-esi belata ihe ize ndụ ahụ? Dị ka akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association (JAMA) si kwuo, nnyocha e mere n’afọ ndị na-adịbeghị anya na-egosi na ihe ize ndụ nke SIDS yiri ka ọ na-ebelata nke ukwuu mgbe e nyiwere ụmụ ọhụrụ ma chee ha ihu n’elu kama ịmakpuwe ha amakpuwe. Ọtụtụ mba amalitewo atụmatụ ime ka ndị mụrụ ụmụ mara ihe jikọtara otú e si edina ala na SIDS. N’Australia, England, Denmark, New Zealand, na Norway, SIDS jiri ma ọ dịkarịa ala pasent 50 belata mgbe e mesịrị mkpọsa ihu ọha iji kwalite inyiwe ụmụ ọhụrụ n’elu ákwà ma chee ha ihu n’elu.
A maghị kpọmkwem ihe jikọtara inyiwe nwa ọhụrụ ma makpuwe ha amakpuwe na SIDS, ma ụfọdụ ndị nnyocha na-ekwu na ịmakpuwe ha amakpuwe pụrụ ime ka nwa ọhụrụ na-ekurughachi ikuku o kupụtara, si otú a na-amụba ikuku carbon dioxide dị n’ọbara ya. Ahụ nwa ọhụrụ ahụ pụkwara ikpobiga ọkụ ókè n’ihi na ọ dịghị ekupụ uzu ọkụ nke ọma ma ọ makpuru amakpuru. Otú o sina dị, ụmụ ọhụrụ e nyiwere ma chee ha ihu n’elu ma ọ bụ makpuwe ha amakpuwe yiri ka ha na-anọgide otú ahụ. Nnyocha e mere na-egosikwa na inyiwe nwa ọhụrụ ahụ dị ma chee ya ihu n’elu dị mma karịa inyiwe ya n’akụkụ ya.
N’ihi gịnị ka ndị nne ji enwe mmasị n’otu ụzọ isi nyiwe nwa ọhụrụ karịa ọzọ? JAMA na-ekwu na ndị nne na-agbasokarị omenala—ha na-enyiwe ụmụ ọhụrụ ha otú nne ha ma ọ bụ ndị ọzọ nọ n’ógbè ha si enyiwe nwa ọhụrụ. Ma ọ bụ ha pụrụ imewe otú ha hụrụ a na-eme n’ụlọ ọgwụ. Ụfọdụ ndị nne na-echekwa na ụmụ ọhụrụ ha na-enwe mmasị karị ma ọ bụ na-ehi ụra nke ọma karị ma e nyiwe ha n’otu ụzọ. Ọtụtụ ndị nne na-enyiwe nwa ọhụrụ ha ma chee ha ihu n’elu oge nile ruo mgbe ọnwa mbụ gafere ma ka oge na-aga malitezie ịmakpuwe ha amakpuwe. “Omume a na-akpata nchegbu,” ka JAMA na-ekwu, “n’ihi na ụmụ ọhụrụ dị malite n’ọnwa 2 ruo ọnwa 3 kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke SIDS.” Ndị dọkịta na-agbalị ime ka ndị nne na nna nwere ụmụ ọhụrụ mara banyere ihe ha sị na ọ bụ ụzọ dị mfe, dị irè nke isi belata ihe ize ndụ nke SIDS—inyiwe ụmụ ọhụrụ ahụ dị ma chee ha ihu n’elu.a
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụrụ na nwa ọhụrụ na-arịa ọrịa iku ume ma ọ bụ na-agụ asọ mmiri otú na-ekwesịghị, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkpọtụrụ dọkịta banyere ụzọ kasị mma isi na-enyiwe nwa ahụ.