Ịdị Ọcha Ndị Kraịst—Ụkpụrụ A Na-aghaghị Ijigide
NDỊ Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ na usoro ime ka a dị ọcha ọ chọrọ, ọ bụ ezie na Iwu dị otú ahụ na omenala ya ka dị irè n’oge Jisọs nọ n’ụwa. (Jọn 11:55) Iwu ahụ nwere “onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa”; “ahụ bụ nke Kraịst.” (Ndị Hibru 10:1; Ndị Kọlọsi 2:17) N’ihi ya, Pọl dere banyere okwu ime ka a dị ọcha a, sị: “Ọ fọdụrụ ihe nta ka m sị na e jikwa ọbara eme ihe nile ka ha dị ọcha, dị ka iwu anyị si dị [Mosis fesara akwụkwọ ahụ, ndị ahụ, ụlọikwuu ahụ, na arịa ndị ahụ ọbara], ọ bụrụkwa na mwụsị ọbara adịghị mgbaghara mmehie adịghị. Ya mere ọ dị mkpa ka e were ihe ndị a mee ka ihe nṅomi nile nke ihe nile dị n’eluigwe dị ọcha.” “N’ihi na a sị na ọbara nke ewu na nke oké ehi, na ntụ́ nke nwa agbọghọ ehi, mgbe ọ na-efesa ndị e merụworo emerụ, na-edo mmadụ nsọ ime ka anụ ahụ ha dị ọcha: ọbara Kraịst, Onye sitere n’aka Mmụọ ebighị ebi chee Onwe ya n’ataghị ụta n’ihu Chineke, ga-esi aṅaa ghara ime akọ na uche anyị ka ọ dị karị ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ ikpere Chineke dị ndụ?”—Ndị Hibru 9:19-23, 13, 14.
Ya mere ọ bụ ọbara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-asacha ndị Kraịst pụọ ná mmehie na ajọ omume nile. (1 Jọn 1:7, 9) Kraịst ‘hụrụ nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya; ka O wee doo ya nsọ, mgbe O mesịrị ka ọ dị ọcha site n’ọsịsa mmiri n’okwu Chineke’ ka o wee bụrụ nke na-enweghị ntụpọ, nke dị nsọ, nke a na-ataghịkwa ụta, “otu ndị nke ga-abụ ndị nke aka Ya, ndị obi ha na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ.” (Ndị Efesọs 5:25-27; Taịtọs 2:14) N’ihi ya, onye ọ bụla so n’ọgbakọ ndị Kraịst a ekwesịghị ‘ichezọ nsachapụ nke mmehie ochie ya nile’ kama o kwesịrị ịnọgide na-egosipụta mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke (2 Pita 1:5-9), na-echeta na “alaka ọ bụla nke na-amị mkpụrụ, Ọ [Chineke] na-emekwa ya ka ọ dị ọcha, ka o wee mịa mkpụrụ karị.”—Jọn 15:2, 3.
Ya mere, ndị Kraịst aghaghị ijigide ụkpụrụ dị elu nke ịdị ọcha nke anụ ahụ, omume, na nke ime mmụọ, na-anọ na nche megide “mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ.” (2 Ndị Kọrint 7:1) N’ihi ihe Jisọs kwuru, na ‘ọ bụghị ihe dị n’ime mmadụ na-emerụ ya kama ọ bụ ihe si n’ime onye ahụ pụta na-emerụ ya,’ ndị a ritere uru n’ọbara Kraịst nke na-eme ka ihe dị ọcha na-eji ịdị ọcha nke ime mmụọ akpọrọ ihe karị. Ha na-anọgide na-enwe ‘obi dị ọcha’ na “akọ na uche dị ọcha” n’ebe Chineke nọ. (Mak 7:15; 1 Timoti 1:5; 3:9; 2 Timoti 1:3) Nye ndị dị otú ahụ nwere akọ na uche dị ọcha “ihe nile dị ọcha,” n’adịghị ka ndị na-enweghị okwukwe bụ́ ndị e merụrụ akọ na uche ha emerụ, ndị ‘ọ na-adịghị ihe ọ bụla dị ọcha’ n’ebe ha nọ. (Taịtọs 1:15) Ndị chọrọ ịnọgide na-adị ọcha n’obi na-aṅa ntị na ndụmọdụ Aịsaịa 52:11, nke na-asị: “Unu emetụla ihe rụrụ arụ: . . . dịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova.” (Abụ Ọma 24:4; Matiu 5:8) Site n’ime nke a, a na-eme ka “aka” ha dị ọcha n’ụzọ ihe atụ (Jemes 4:8), Chineke na-emesokwa ha dị ka ndị dị ọcha.—2 Samuel 22:27; Abụ Ọma 18:26; leekwa Daniel 11:35; 12:10.