Iguzosi Ike Mgbe Ndị Nazi Weghaara Netherlands
EBE Ndebe Ihe Ncheta Oké Mgbukpọ ahụ nke United States (USHMM) nwere nkwakọba kasị n’ọnụ ọgụgụ n’ụwa nke arịa na ihe nkiri ndị na-atụle mpụ ndị Nazi mere n’Agha Ụwa nke Abụọ. Kemgbe e kwere ka ọha na eze na-abanye n’ebe ndebe ihe ochie ahụ na 1993, ihe dị ka nde ndị nleta 12 enyochawo ebe ndebe ihe ochie a na-ewuwanye ewu, bụ́ nke dị na Washington, D.C.
Ebe ndebe ihe ochie ahụ nwekwara ụfọdụ ihe ncheta nke oké mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova n’oge ọchịchị ndị Nazi. Tinyere ihe ole na ole na-adịgide adịgide a na-egosi banyere ha, USHMM ewepụtawo ọtụtụ ihe omume pụrụ iche banyere Ndịàmà Jehova. Ihe omume ndị a emewo ka ihe atụ ụfọdụ nke ntachi obi na iguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova pụta ìhè. N’April 8, 1999, ebe ndebe ihe ochie ahụ kwadoro otu ihe omume pụrụ iche nke isiokwu ya bụ́ “Ndịàmà Jehova na Netherlands nke Ndị Nazi Weghaara.” E mere ya ná nnukwu ụlọ mgbakọ abụọ nke ebe ndebe ihe ochie ahụ.
Ihe omume ahụ malitere n’okwu mmeghe nke Nwaada Sara Jane Bloomfield, bụ́ onye nduzi ukwuu nke USHMM. Nwaada Bloomfield kwupụtara ezi mmasị o nwere n’akụkọ banyere Ndịàmà Jehova. N’ajụjụ ọnụ Teta! gbara ya, ọ kọwara na a na-eme mgbalị dị ukwuu iji mee ka ọha na eze marakwuo banyere iguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova n’oge mkpagbu. “A na-akpọsa ihe ndị dị ka nke a,” ka o kwuru, “n’otu ụzọ ahụ e si akpọsa ihe omume ndị ọzọ dị mkpa a na-enwe n’ebe ndebe ihe ochie a.”
Ná mgbede ahụ, ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nọ n’ebe ahụ ma kere òkè n’ihe omume ahụ. Otu n’ime ha bụ Dr. Lawrence Baron, bụ́ prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme nke ndị Germany na ndị Juu nke oge a na Mahadum Steeti San Diego. N’okwu ya, Dr. Baron kwuru na “Ndịàmà Jehova jụwara isi isoro Alaeze Ukwu nke Atọ ahụ nwee njikọ ọ bụla.” O kwuru na Ndịàmà “ji okwukwe n’ebe Chineke nọ kpọrọ ihe karịa ime ihe ndị ọchịchị Nazi chọrọ. Ha lere ife idu ndú ofufe nke Hitler anya dị ka ụdị ofufe ụwa ma jụ ịkwado omume a na-eme ya chi site n’ikele ya ekele ndị Nazi ma ọ bụ ikwu, ‘Heil Hitler.’ . . . Ebe ọ bụ na Chineke nyere ha iwu ịhụ ndị agbata obi ha n’anya na ịghara igbu ndị ọzọ, ha jụrụ ije ozi agha . . . Mgbe Alaeze Ukwu nke Atọ ahụ nyere ha iwu ka ha kwụsị ikpe okpukpe ha, Ndịàmà na-azaghachikarị, ‘Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.’” N’ihi nke a, a kpọgara ọtụtụ Ndịàmà si n’ọtụtụ mba ndị dị na Europe n’ogige ịta ahụhụ, taa ha ahụhụ, ọbụna gbuokwa ha.
Ndị USHMM kpọrọ ndị nnyocha bụ́ ndị Netherlands na ìgwè ndị lanarịrị Oké Mgbukpọ ahụ òkù inye ihe atụ nke mkpagbu ndị Nazi kpagburu Ndịàmà Jehova na Netherlands. Na May 29, 1940, nwa oge mgbe ndị Nazi weghasịịrị Netherlands, a machibidoro Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị dị ihe dị ka 500 n’ọnụ ọgụgụ, iwu ná mba ahụ. N’ime ọnwa ndị sochirinụ, e jidere ọtụtụ narị Ndịàmà. Ná mgbalị inweta aha Ndịàmà ndị ọzọ, ndị ọchịchị tara ndị ahụ e jidere ahụhụ. Mgbe agha ahụ na-akwụsịla, e jidewo ihe karịrị Ndịàmà 450. N’ime ndị a, ihe karịrị 120 nwụrụ n’ihi mkpagbu ahụ kpọmkwem.
Otu onye nnyocha bụ́ onye Netherlands kọwara na n’ebe ndebe ihe nke alaka ụlọ ọrụ Netherlands nke Watch Tower Society, e nwere “ihe karịrị vidio 170 nke ajụjụ ọnụ a gbara ha na akụkọ ndụ 200 ndị e dere ede nke Ndịàmà Jehova nọ na Netherlands bụ́ ndị lanarịrị Oké Mgbukpọ ahụ. Ha nile na-egosi na ihe kpaliri Ndịàmà ahụ bụ ịhụnanya ha hụrụ Chineke na mmadụ ibe ha.”
Ọtụtụ ndị kwuru okwu mesiri eziokwu ahụ ike nke bụ́ na n’adịghị ka ìgwè ndị ọzọ ndị Nazi lekwasịrị anya, ihe ka ọtụtụ ná Ndịàmà Jehova gaara enwe ike inwere onwe ha nanị site n’ịbịanye aka n’akwụkwọ na-egosi na ha ajụwo nkwenkwe ha. N’agbanyeghị nke ahụ, ma ndị kwuru okwu ma ndị a gbara ajụjụ ọnụ kọwara na ihe ka n’ọtụtụ Ndịàmà mere nhọrọ ezi uche dị na ya na nke dabeere n’ihe ha maara ịnakwere mkpagbu kama ịjụ okwukwe ha. Mmadụ ole na ole bịanyere aka n’ihi na ha chọrọ ịkwụsị mkpakọrịta ha na Ndịàmà Jehova.
E nwere ụfọdụ ndị bịanyere aka n’akwụkwọ nkwupụta ahụ n’ihi inwe mgbagwoju anya. Ọ dịtụghị mgbe ndị a chọrọ ịhapụ ụdị ofufe ha. Mmadụ ole na ole chere na o ziri ezi n’ụzọ omume ịghọgbu ndị na-akpagbu ha iji nwere onwe ha ma laghachi n’ọrụ nkwusa ha. Ka a tọhapụsịrị ha, ha ghọtara na n’agbanyeghị ebumnobi ha, ịbịanye aka n’akwụkwọ nkwupụta ahụ ezighị ezi.
Mkpebi ha na-emetaghị emeghị ka e kewapụ ha iche. Ka ha laghachiri n’ụlọ na n’ọgbakọ ha dị iche iche, e nyeere ha aka n’ụzọ ime mmụọ. Otu akwụkwọ ozi nke alaka ụlọ ọrụ Netherlands nke Watch Tower Society dere, bụ́ nke akara ụbọchị ya bụ́ June 1942, gbara Ndịàmà nọ n’ala ahụ ume ka ha ghọta ihe ndị dugara ụfọdụ n’ịbịanye aka n’akwụkwọ nkwupụta ahụ nakwa ka ha mesoo ha ihe n’ụzọ obi ebere. Ọ bụ ezie na mweghara ahụ ndị Nazi weghaara Netherlands abịabeghị ná njedebe, n’oge na-adịghị anya ndị a bụbu ndị mkpọrọ maliteghachiri ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ, na-emekwa nke a n’oké ihe ize ndụ. E jidere ụfọdụ nke ugboro abụọ. Ọbụna e gburu otu n’ime ha n’ihi na ọ jụrụ ikere òkè n’ọrụ agha.
N’agbanyeghị oké ahụhụ na ọtụtụ afọ nke ọrụ nzuzo siri ike, nke dị ize ndụ, Ndịàmà Jehova nọ na Netherlands mụbara site n’ihe dị ka 500 na 1940 ruo ihe karịrị 2,000 mgbe ọchịchị ndị Nazi bịara ná njedebe na 1945. Obi ike na mkpebisi ike ha irubere Chineke isi ka bụ ezigbo ihe àmà n’oge a.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị nnyocha gwara ìgwè ahụ gbakọtaranụ okwu
[Foto dị na peeji nke 23]
Ịgba ndị Netherlands lanarịrị Oké Mgbukpọ ahụ ajụjụ ọnụ