Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 11/8 p. 32
  • Ihe Osise Ọ Na-apụghị Ichezọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Osise Ọ Na-apụghị Ichezọ
  • Teta!—1999
Teta!—1999
g99 11/8 p. 32

Ihe Osise Ọ Na-apụghị Ichezọ

KAREN, onye bụworo otu n’ime Ndịàmà Jehova ruo ihe karịrị afọ iri abụọ, chọpụtara na papa ya enwetụghị mmasị n’iso ya kwurịta banyere okpukpe. Otú ọ dị, na nso nso a, nke ahụ gbanwere. Ọ nọrọ n’ụlọ ọgwụ, na-agbake n’ahụ a wara ya. Otu ụbọchị, n’ihi oké ịtụ ọ̀bọ̀, ọ gụchara otu akwụkwọ akụkọ. Akpata oyi wụrụ ya n’ahụ. Ka e mesịrị, mgbe ọ lọtasịrị ụlọ, ọ kpọrọ nwa ya nwanyị. Karen na-akọ, sị: “Papa m gwara m na fon, sị, ‘Karen, ụwa emebiwo.’ Ihe kpasukarịsịrị ya iwe bụ ụzọ e si emeso ụmụaka.

“Ọbụna tupu m nwee ohere ịgba ya ume, o kwuru na mberede, sị: ‘Ụmụ nwanyị abụọ bịara n’ụlọ m taa. Ana m anọkarị n’ubi dị n’azụ ụlọ m, ma ha hụrụ m mgbe m pụtara n’ihu èzí. Otu nwanyị gosiri m otu ubi mara mma e sere ese. Achọrọ m ịgwa ya, sị, “Echere m na i kwesịrị ịhụ azụ ụlọ m—ọ bụ ubi mara mma,” ma agwaghị m ya. O kwuziri na n’oge na-adịghị anya ụwa nile ga-enwe udo. O kwuru na ọ ga-adị ka ubi ahụ, nke onye ọ bụla ga-anụ ụtọ ya. Ewereghị m akwụkwọ ahụ. Ma mgbe ha lara, apụghị m ichezọ ihe osise ahụ. Anọgidela m nnọọ na-eche banyere ya na echiche nke onye ọ bụla ịnọ n’udo. Ị̀ maara akwụkwọ m na-ekwu? Ị̀ pụrụ iwetara m otu?’”

Obi tọrọ Karen ụtọ ime nke ahụ. Ihe osise papa ya zoro aka na ya bụ nke ahụ ị na-ahụ n’ebe a. Isiokwu akwụkwọ ahụ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ̀ ga-amasị gị ịmatakwu banyere nkwa Bible na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ ubi zuru ụwa ọnụ bụ́ ebe ụmụ mmadụ ga-ebi n’udo? Ị pụrụ ịmata otú ị ga-esi nweta akwụkwọ a site n’idejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e depụtara na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 5 na magazin a.

□ Gwanụ m otú m pụrụ isi nweta akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.

Kwuo asụsụ nke ọ bụ.

□ Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya