Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 1/8 p. 32
  • Onye Nwere Obi Abụọ Ma Ka Nọgide Na-achọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Onye Nwere Obi Abụọ Ma Ka Nọgide Na-achọ
  • Teta!—2001
Teta!—2001
g01 1/8 p. 32

Onye Nwere Obi Abụọ Ma Ka Nọgide Na-achọ

N’AKWỤKWỌ ozi e degaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Slovenia, otu nwoke nke kwuru na ya bụ onye Roman Katọlik e mere baptism rịọrọ, sị: “Biko ziterenụ m otu broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ọ ga-amasịkwa m inweta ihe ọmụma banyere otú m pụrụ isi na-enweta magazin Teta! mgbe nile n’ụlọ m.”

Nwoke ahụ kọwara, sị: “Biko unu aghọtahiela m. Ana m enwe obi abụọ banyere okpukpe, ma ọ fọrọ nke nta ka akpata oyi wụọ m n’ahụ mgbe m gụrụ Teta! n’ihi na ọ dịghị ekwesi olu ike kama ọ na-akọwa ihe n’ụzọ doro anya ma na-ezi ihe.” Mgbe ahụ o zoro aka n’otu magazin okpukpe a ma ama ma kwuo na ọ na-emegharị nnọọ ndị mmadụ anya.

Nwoke ahụ kọwara ihe mere na ya edejupụtaghị akwụkwọ ahụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị n’azụ Teta! iji rịọ ka e nye ya broshuọ Na-achọ ma họrọ iji aka ya deta akwụkwọ ozi. “Achọghị m imebi magazin Teta!” ka o kwuru. “Achọrọ m ka ihe ọ bụla ghara ịpụ na ya!”

Broshuọ ahụ nwere peeji 32 bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? nwere ihe ọmụmụ 16. N’ime ha, e kwuru banyere ozizi ndị bụ́ isi nke Bible, sikwa na Bible weta ihe ọmụma igosi ihe dị mkpa ka anyị mee iji nweta nnwapụta Chineke. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

[Foto dị na peeji nke 32]

Nde 113 n’asụsụ 240

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya