Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 6/8 p. 32
  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Imeri Ihe Ịma Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Inyere Ndị Mmadụ Aka Imeri Ihe Ịma Aka
  • Teta!—2001
Teta!—2001
g01 6/8 p. 32

Inyere Ndị Mmadụ Aka Imeri Ihe Ịma Aka

ALAKA ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Sri Lanka nwetara akwụkwọ ozi sitere n’aka odeakwụkwọ Òtù Na-ahụ Maka Ọdịmma Ndị Ntorobịa na Ndị Ọrụ n’Ógbè Ọwụwa Anyanwụ. Odeakwụkwọ ahụ rịọrọ maka Teta! ụfọdụ e bipụtara n’oge ndị gara aga ma kwuo, sị:

“Mụ na ndị ibe m ahụwo magazin ndị unu ziteere m dị ka ndị na-ezi ihe, na-enye ihe ọmụma, ma na-akpali akpali nakwa ndị ezi uche dị na ha, ndị na-emekwa ka e kwenye n’ihe. Magazin ndị ahụ adịghị eji ebumnobi na-apụtaghị ìhè agbasa ozizi ndị Kraịst, dị ka ụfọdụ pụrụ ikwu n’ụzọ na-ezighị ezi. Nye m, ha bụ akwụkwọ ọgụgụ ndị magburu onwe ha.

“Ọchịchọ a na-achọ Teta! (ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie) na-arị elu, ihe àmà nile na-egosikwa na ọchịchọ a a na-achọ ya ga-anọgide na-arị elu n’ọnwa ndị na-abịa abịa. Isiokwu ndị dị na magazin unu na-enye ndị agadi, ndị ntorobịa, na ụmụaka, ihe ọmụma. Ha na-enyere mmadụ nile aka imeri ihe ịma aka dị iche iche nke oge a nakwa ndị ga-abịa n’ọdịnihu bụ́ ndị ejighị okpukpe kpọrọ ihe na-akpata.”

Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla n’akụkọ ihe mere eme ndị mmadụ nọ n’afọ ndụ nile chere ihe ịma aka ndị ha na-eche ihu taa, ihu. Ọtụtụ ndị na-eche karịsịa ihe ọdịnihu ga-abụ nakwa ma è nwere Chineke nke na-eche banyere ha. A zara ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ụzọ na-eju afọ na broshuọ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya