Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 3/8 p. 32
  • Echiche Ziri Ezi E Ji Dee Ha Masịrị Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echiche Ziri Ezi E Ji Dee Ha Masịrị Ya
  • Teta!—2001
Teta!—2001
g01 3/8 p. 32

Echiche Ziri Ezi E Ji Dee Ha Masịrị Ya

OTU PRỌFESỌ NA MAHADUM dị na Spain degaara alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị ná mba ya akwụkwọ iji kwupụta ekele o nwere maka Teta! Ọ kọwara, sị:

“Enwetara m abụọ n’ime akwụkwọ unu bụ́ Teta! na nso nso a. Achọpụtara m na ha nwere isiokwu dịgasị iche na-adọrọ nnọọ mmasị. Anọghị m n’òtù okpukpe ọ bụla, ma enwere m mmasị n’echiche ziri ezi nke mbipụta ahụ. O nwekwara ọdịdị magburu onwe ya, ọ na-atụlekwa isiokwu dị iche iche n’eleghị mmadụ anya n’ihu nakwa site n’echiche nkà mmụta sayensị. Ana m ekele unu maka mgbalị unu na-eme.”

N’ọtụtụ n’ime isiokwu ya, Teta! na-achịkọta ihe àmà dị iche iche site na ngalaba sayensị dịgasị iche bụ́ ndị na-enyere ndị na-agụ ya aka iru ná nkwubi okwu dabeere n’ezi ihe ọmụma. E mekwara otú ahụ na broshuọ nwere peeji 32 bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? Dị ka ihe atụ, n’okpuru isiokwu nta ndị bụ́ “Ndụ Ọ̀ Malitere ná Ndabara?” na “Nhazi Chọrọ Onye Nhazi,” ndị ọnụ na-eru n’okwu na nkà mmụta mbara igwe, nkà mmụta ihe ndị dị ndụ anya nkịtị na-adịghị ahụ, na physics nyere ihe àmà nke metụtara ihe e kwuru.

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta broshuọ a bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta ma zite akwụkwọ na-esonụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Ụyọkọ kpakpando: Site n’ikike a natara Anglo-Australian Observatory, foto nke David Malin sere

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya