Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 5/8 p. 3
  • Nsogbu Dị n’Ụlọ Mkpọrọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsogbu Dị n’Ụlọ Mkpọrọ
  • Teta!—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ngwọta Ya Ò So Akpata Nsogbu Ahụ?
    Teta!—2001
  • “À Pụrụ Ime Ka Ndị Mkpọrọ Gbanwee?”
    Teta!—2005
  • Ime Ka Ha Gbanwee n’Ezie—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
    Teta!—2001
  • Akụkọ Okwukwe Sitere n’Ụlọ Mkpọrọ Mere Ihe Akụkọ
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2001
g01 5/8 p. 3

Nsogbu Dị n’Ụlọ Mkpọrọ

“Iwukwu ụlọ mkpọrọ iji kwụsị mpụ yiri iwukwu ebe a na-eli ozu iji kwụsị ọrịa na-egbu egbu.”—ROBERT GANGI, ỌKÀ N’ỊGBAZI OMUME.

N’ỤWA ebe a na-ejikarị ire ụtọ ekpuchi ọnọdụ ọjọọ, anyị nwere okwu ndị ọzọ dị mma a pụrụ iji dochie anya okwu na-akụda mmụọ bụ́ “ụlọ mkpọrọ.” Anyị na-ahọrọ “ebe a na-edebe ndị e ji eji” ma ọ bụ “ogige mgbazi omume,” bụ́ ebe a na-enye “ọzụzụ n’ọrụ nkà” ma na-ejere “ọha na eze ozi.” Anyị na-eji ọbụna okwu bụ́ “onye e ji eji” eme ihe kama iji okwu na-egosi afọ ịta mmiri bụ́ “onye mkpọrọ.” Ma, leba anya n’ime, ị ga-ahụ na ụlọ mkpọrọ na-eche nsogbu ndị siri ike ihu taa, dị ka ihe na-adịwanye ukwuu ọ na-efu iji debe ndị dara iwu n’ụlọ mkpọrọ na ọdịiche na-ebuwanye ibu nke dị n’etiti nzube nke ịtụ mkpọrọ na ihe ndị ọ na-arụpụta n’ezie.

Ụfọdụ ndị ekwetaghị na ụlọ mkpọrọ na-arụpụta ihe. Ha na-ekwu na ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ndị mkpọrọ nọ n’ụwa nile arịruwo ihe karịrị nde asatọ, ọnụ ọgụgụ mpụ a na-eme n’ọtụtụ ala adalatabeghị nke ukwuu. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị a tụrụ mkpọrọ bụ n’ihi mpụ ndị metụtara ọgwụ ọjọọ, nnweta a pụrụ inweta ọgwụ ọjọọ n’ebe ndị a na-eme mpụ ka na-akpata oké nchegbu.

Ka o sina dị, ọtụtụ ndị na-ele ịtụ mkpọrọ anya dị ka ntaramahụhụ ha ga-ahọrọ. Mgbe a tụrụ onye ahụ dara iwu mkpọrọ, ha na-eche na ọ bụ ihe kwesịịrị ya. Otu odeakụkọ kọwara ịnụ ọkụ n’obi e ji atụ ndị omempụ mkpọrọ dị ka “ntịwapụ nke ịtụ mkpọrọ.”

E nwere ihe anọ bụ́ isi mere e ji atụba ndị dara iwu n’ụlọ mkpọrọ: (1) iji nye ndị dara iwu ntaramahụhụ, (2) iji chebe ọha na eze, (3) iji gbochie ime mpụ n’ọdịnihu, na (4) iji mee ka ndị omempụ gbanwee, na-akụziri ha irube isi n’iwu na ịrụpụta ihe mgbe a tọhapụsịrị ha. Ka anyị lee ma ụlọ mkpọrọ hà na-emezu nzube ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya