Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g01 7/8 p. 32
  • Enyemaka Mgbe Onye A Hụrụ N’anya Nwụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enyemaka Mgbe Onye A Hụrụ N’anya Nwụrụ
  • Teta!—2001
Teta!—2001
g01 7/8 p. 32

Enyemaka Mgbe Onye A Hụrụ N’anya Nwụrụ

Afọ ụfọdụ gara aga, Ndịàmà Jehova bipụtara otu broshuọ nke tụlere ihe ịma aka nke ịnagide ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Na nso nso a, a natara otu akwụkwọ ozi nke otu onye gụrụ ya ma nwee ekele bụ́ onye nọ na Federal Republic of Yugoslavia dere, na-asị: “Ọ ga-amasị m ikele unu site n’ala ala obi m maka broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. N’ezie, o kwuru okwu n’ụzọ zuru ezu banyere ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya.”

Onye dere akwụkwọ ozi ahụ kọwara, sị: “Mgbe nwanne m nwoke nwụnahụrụ m n’ihe mberede okporo ụzọ, broshuọ ahụ wetaara m ‘enyemaka ozugbo.’ Akụkụ bụ́ ‘Aro Ụfọdụ Ndị Bara Uru,’ nke dị na peeji nke 18, kasiri m nnọọ obi. Otú ọ dị, mgbe ọnwa anọ gasịrị, amalitere m inwe ihe mgbu miri nnọọ emi tinyere ọchịchọ siri ike ka ihe dịghachi otú ọ dịbu. Egwu tụrụ m na ọnọdụ mmetụta uche m nọ n’ihe ize ndụ.

“Ọzọ, agụrụ m broshuọ a, na peeji nke 9, n’igbe bụ́ ‘Usoro Iru Újú,’ achọpụtakwara m na iru újú na ọchịchọ siri ike ka ihe dịghachi otú ọ dịbu bụ ihe ndị a na-ahụ n’oge mgbake. Enwetara m nkasi obi n’ezie. Unu emeela maka obi ebere unu, bụ́ nke unu gosipụtara site na broshuọ a.”

Ikekwe gị onwe gị ma ọ bụ onye ị maara ga-enwetakwa nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a dị peeji 32. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 nke magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya