Ịgba Ohu—Omume Ọjọọ Ahụ Ka Na-aga N’Ihu
ỊGBA ohu ọ̀ kwụsịwo? Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ ga-achọ iche otú ahụ. Okwu ahụ n’onwe ya na-echetara mmadụ banyere obi ọjọọ na mmegbu. Otú ọ dị, n’uche ọtụtụ ndị, ihe ndị ahụ agawo. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-eji uche ha ahụ ụgbọ mmiri e ji ebu ndị ohu na narị afọ ndị gaworo aga—ụgbọ mmiri ndị e ji osisi rụọ bụ́ ndị na-eme mkpọtụ, bụ́ ndị nwere ime ụlọ ndị a fọkọjuru ụmụ mmadụ ụjọ ji, fọkọta ha ọnụ n’ebe ruru ajọ unyi.
N’eziokwu, ụgbọ mmiri ndị dị otú ahụ e ji ebu ndị ohu adịghịzi agba n’oké osimiri, nkwekọrịta mba nile ndị e nwere n’oge a machibidokwara ụdị ịgba ohu ahụ iwu. Ma, ịgba ohu akwụsịbeghị ma ọlị. Òtù na-ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ Òtù Mba Nile nke Na-emegide Ịgba Ohu na-eme atụmatụ na nde mmadụ 200 ka nọ n’ohu n’ụzọ ụfọdụ. Ha na-arụ ọrụ n’ọnọdụ ndị pụrụ ịdị nnọọ njọ karịa nke ndị ohu nke narị afọ ndị gara aga nọrọ na ha. N’ezie, ụfọdụ ndị nnyocha na-ekwubi na e nwere “ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ nọ n’ohu taa karịa otú e nwere mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme.”
Akụkọ banyere ndị ohu nke oge a na-agbawa obi. Kanji,a bụ́ onye dị nanị afọ iri, na-achịrị ndị nwe ya dị obi ọjọọ ehi kwa ụbọchị, bụ́ ndị na-eti ya ihe mgbe mgbe. “Ọ bụrụ na m enwee chi ọma, m na-enweta bred ochie, ma ọ́ bụghị ya, m na-anọ agụụ ụbọchị ahụ nile,” ka ọ na-akọwa. “A kwụtụbeghị m ụgwọ maka ọrụ m na-arụ n’ihi na abụ m ohu ha na ihe onwunwe ha. . . . Ụmụaka ndị ọgbọ m so ụmụaka ibe ha na-egwuri egwu, ọ kakwaara m mma ịnwụ anwụ karịa ibi ụdị ndụ ọjọọ a.”
Dị ka Kanji, ndị ohu nke oge a na-abụkarị ụmụaka ma ọ bụ ụmụ nwanyị. N’ụzọ megidere ọchịchọ ha, ha na-adọgbu onwe ha n’ọrụ na-arụ kapet, na-arụ okporo ụzọ, na-egbu okpete, ma ọ bụ ọbụna na-arụ ọrụ dị ka ndị akwụna. A pụkwara ire ha nanị $10. Ọbụna ụmụaka ụfọdụ bụ ndị nne na nna ha n’onwe ha na-erenye n’ịbụ ohu iji kwụọ nnukwute ụgwọ ndị ha ji.
Akụkọ ndị dị otú ahụ hà na-awụ gị akpata oyi n’ahụ́? Ọ bụghị nanị gị. N’akwụkwọ ya bụ́ Disposable People, onye na-ede akwụkwọ bụ́ Kevin Bales na-ekwu, sị: “Ịgba ohu bụ ihe jọgburu onwe ya. Ọ bụghị nanị izuru ndọlị mmadụ n’ohi; ọ bụ izuru ndụ ya dum n’ohi.” N’ihi mmeso ọjọọ mmadụ na-emeso ibe ya, olee ihe mere anyị ga-eji kwere na omume ọjọọ nke ịgba ohu nwere mgbe ọ ga-akwụsị? Ajụjụ a gbasara gị karịa ka ị pụrụ icheworị.
Dị ka anyị ga-ahụ, e nwere ihe karịrị otu ụdị nke ịgba ohu. Ọ dị n’ụdị dịgasị iche iche, ndị ụfọdụ n’ime ha na-emetụta onye ọ bụla dị ndụ. Ya mere, ọ dị anyị nile mkpa ịmata ma ọ̀ dị mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ga-enweta ezigbo nnwere onwe. Ma, ka anyị buru ụzọ tụlee ná mkpirikpi akụkọ ihe mere eme banyere ịzụ na ire ụmụ mmadụ dị ka ohu.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ọ dịwo anya a na-ere ma na-azụrụ ụmụ nwanyị na ụmụaka dara ogbenye dị ka ohu
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto dị n’elu: UN PHOTO 148000/Jean Pierre Laffont
Foto U.S. National Archives