“Ọ Bịara n’Oge Kwesịrị Ekwesị”
N KE ahụ bụ ihe otu nwoke bi n’obodo bụ́ Abakaliki kwuru n’akwụkwọ ozi o detaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nigeria. Ọ na-ezo aka na broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, bụ́ nke e nyere ya n’oge na-adịbeghị anya. Ọ kọwara, sị:
“Nwunye m m hụrụ n’anya, bụ́ Tochi, nwụnahụrụ m n’oge na-adịghị anya ọ mụsịrị nwa na June 18, 2000. N’ihe karịrị otu ọnwa mgbe nke ahụ mesịrị, enwetabeghị m onwe m pụọ ná ntigharị anya, ahụ́ nsinwụ, mmetụta nke ịtọgbọrọ chakoo, na iri ọnụ ndị sitere n’otu n’ime ọdachi ndị kasị nnọọ akpasasị uche ndị dakwasịtụworo m. E mesịa, na July, otu n’ime Ndịàmà Jehova nyere m otu akwụkwọ unu bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Broshuọ ahụ dịịrị m ka ọgwụ, amalitewokwa m inweta onwe m nke nta nke nta—site n’enyemaka nke ndụmọdụ dị n’ime ya. O mere ka m nweghachi olileanya n’ezie ma mee ka m ghọta na n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ahụ, olileanya dị.”
Ikekwe gị onwe gị ma ọ bụ onye ị maara ga-enwetakwa nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a nwere peeji 32. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.