Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g02 10/8 p. 32
  • Ndụ Ezinụlọ Na-enye Obi Ụtọ Ga-ekwe Omume!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndụ Ezinụlọ Na-enye Obi Ụtọ Ga-ekwe Omume!
  • Teta!—2002
Teta!—2002
g02 10/8 p. 32

Ndụ Ezinụlọ Na-enye Obi Ụtọ Ga-ekwe Omume!

OTU nwanyị si n’obodo Maladzyechna, nke dị na Belarus, detaara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Russia akwụkwọ. O kwuru na ya nwere di na ụmụ abụọ. O dere, sị: “Mụ na di m hụrụ onwe anyị n’anya. Otú ọ dị, achọpụtara m na ka anyị na-ebitekwu aka, otú ahụ ka anyị na-ewewanye iwe ma na-arụwanye ụka, n’enwetụghị ihe ọ bụla kpatara ya. Ọnwa ole na ole gara aga, otu onye m na-amaghị kwụsịrị m n’okporo ámá ma nye m otu traktị bụ́ Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ. Na mbụ, anya m gara n’ihe osise mara mma nke ezinụlọ nwere obi ụtọ. E mesịa, agụrụ m ihe e dere na ya ma nye ya di m ka ọ gụọ.

“Dị ka a ga-asị na ọ bụ ọrụ ebube, ọ bụghị nanị na ndụ ezinụlọ anyị akawo mma kama, m ga-asị na ọ gbanwewo kpam kpam. Anyị aghọtawo ugbu a na inwe obi ụtọ esighị nnọọ ike otú ahụ. Nanị ihe dị mkpa bụ inwetụkwu ezi ịhụnanya nke sitere n’obi na inye ihe. Ihe dị mkpa bụ ibi ndụ kwekọrọ n’iwu Chineke, ịhụ Chineke n’anya na ịhụ ndị mmadụ n’anya, gụnyere ndị ezinụlọ na ndị anyị na-amaghị.”

O kwubiri, sị: “Ndụ adịkwuola ụtọ ma na-enye obi ụtọ karị. Anyị chọrọ ịnọgide na-amụ Bible ma na-akụziri ụmụ anyị ihe.”

Anyị chere na gị onwe gị kwa pụrụ irite uru site na traktị ahụ bụ́ Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ. Obi ga-adịkwa anyị ụtọ ma i nwetakwuo akwụkwọ ahụ nwere peeji 192 bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu n’ime traktị a na akwụkwọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya