Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g03 2/8 p. 32
  • Ọ Bụ Ikuku Butere Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Bụ Ikuku Butere Ya
  • Teta!—2003
Teta!—2003
g03 2/8 p. 32

Ọ Bụ Ikuku Butere Ya

Otu nwa amadị nọ na-aga n’okporo ámá Mumbai, India, mgbe ikuku busara otu mpempe akwụkwọ n’ụkwụ ya. Ọ bụ Akụkọ Alaeze nke 36, nke isiokwu ya bụ “Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?” Isiokwu ahụ dọọrọ mmasị ya. N’egbughị oge ọ bụla, ọ tụtụlitere mpempe akwụkwọ ahụ a pịara apịa ma gụchapụ ya. A kpaliri mmasị ya, n’ịbụkwa onye chọrọ inwetakwu ihe ọmụma, ọ rịọrọ ka e zitere ya Bible na mbipụta ndị ọzọ.

Mpempe akwụkwọ ahụ a pịara apịa, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara, bu ihe ọmụma ndị na-ewusi okwukwe ike. Ọ na-akọwa n’ụzọ doro anya na ọ bụ “anyaukwu, enweghị ntụkwasị obi, na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị—àgwà ndị a na-apụghị ikpochapụ nanị site ná nnyocha sayensị, nkà na ụzụ, ma ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị,” na-akpata nsogbu ndị anyị na-enwe taa, bụ́ ndị gụnyere ọrịa, ịda ogbenye, na agha. Traktị ahụ na-egosikwa na n’ọdịnihu dị nso, Chineke ga-ekpochapụ mmebi iwu nile n’ụwa a.

Ọ̀ ga-amasị gị ịmụtakwu banyere nkwa ndị Bible na-ekwe maka ọdịnihu? Ndịàmà Jehova na-akụzi Bible n’ebe obibi ọtụtụ nde ndị mmadụ, na-eji akwụkwọ ndị dabeere na Bible eme ihe, gụnyere broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Broshuọ a na-aza ajụjụ ndị dị ka: Ònye bụ Chineke? Gịnị bụ nzube Chineke maka ụwa? Gịnị bụ Alaeze Chineke? Olee otú Bible pụrụ isi mee ka ndụ ezinụlọ gị ka mma?

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ka Ndịàmà Jehova kpọtụrụ gị n’ebe obibi gị iji nyere gị aka ịghọta ihe Chineke ga-eme n’ọdịnihu dị nso, obi ga-adị ha ụtọ ime otú ahụ, ha ga-enyekwa gị ihe ọmụma ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya