Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/06 p. 5
  • Echi Ọ̀ Ga-aka Mma?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Echi Ọ̀ Ga-aka Mma?
  • Teta!—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụwa Ọ̀ Ga-ala n’Iyi n’Oge Na-adịghị Anya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Okwukwe na Ọdịnihu Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olileanya E Ji n’Aka na Ihe Ga-adị Mma n’Ọdịnihu
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Akụkụ nke 2—Ụwa nke Ahụhụ Na-adịghị
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2006
g 1/06 p. 5

Echi Ọ̀ Ga-aka Mma?

Ndị mmadụ na-enwe mmasị dị ukwuu banyere ọdịnihu. Olee onye n’ime anyị nke na-agaghị achọ ịma ihe anyị ga-eme n’ọnwa ọzọ, n’afọ ọzọ, ma ọ bụ ọbụna n’afọ iri na-abịa abịa? E lee ya anya n’ụzọ sakwuru mbara, olee ihe ụwa a ga-adị ka ya n’afọ 10, 20, ma ọ bụ afọ 30 na-abịa abịa?

Ì NWERE olileanya na ọdịnihu ga-adị mma? Ọtụtụ nde mmadụ nwere. A pụrụ ikewa ndị nwere olileanya dị otú a ụzọ abụọ: ndị nke sịrị na ha nwere ezi ihe mere ha ji nwee ya, na ndị nke nwere ya nanị n’ihi na ha achọtụghị ichewe echiche na ihe ga-adị njọ.

N’ezie, ụfọdụ ndị enweghị olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị e ji ibu amụma banyere ọdachi mara, bụ́ ndị o yiri ka ọ̀ na-atọ ụtọ ịkpọsa na a ga-ebibi ụwa. Dị ka ha si ele ọdịnihu anya, ọ bụrụ na o nwere ndị ga-alanahụ, ọ ga-abụ mmadụ ole na ole.

Olee otú i si ele ọdịnihu anya? Ihe ị na-ahụ ọ̀ bụ mbibi a ga-ebibi ụwa ka ọ̀ bụ ụwa nke ndị mmadụ ga-anọ n’udo nakwa ná nchebe? Ọ bụrụ na ọ bụ ụwa nke ndị mmadụ ga-anọ n’udo nakwa ná nchebe, gịnị mere i ji nwee olileanya dị otú ahụ—ì nwere ihe àmà kara gị obi, ka ihe mere i ji nwee ya ọ̀ bụ nanị n’ihi na ọ na-agụ gị agụụ ka ọ dị otú ahụ?

N’adịghị ka ndị ahụ e ji ibu amụma banyere ọdachi mara, ndị na-ebipụta Teta! ekwetaghị na a ga-ekpochapụ ihe nile a kpọrọ mmadụ. Kama nke ahụ, Bible na-enye ihe àmà gbara ọkpụrụkpụ mere a ga-eji kwere na ihe ga-amagbu onwe ya n’ọdịnihu.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Foto nke U.S. Department of Energy

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya