Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/10 p. 6
  • Ihe nke Anọ: Ịkwanyere Ibe Ha Ùgwù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe nke Anọ: Ịkwanyere Ibe Ha Ùgwù
  • Teta!—2010
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agwa Ibe Ha Okwu Ọjọọ
    Teta!—2013
  • Mgbe Arụmụka Bilitere n’Etiti Di na Nwunye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ikpughe Mkpọrọgwụ nke Nkwulu
    Teta!—1996
  • Na-ekwu ‘Okwu Dị Mma Maka Iwuli Mmadụ Elu’
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2010
g 1/10 p. 6

Ihe nke Anọ: Ịkwanyere Ibe Ha Ùgwù

“Wepụnụ . . . iti mkpu na okwu mkparị . . . niile.” —Ndị Efesọs 4:31.

Gịnị ka ọ pụtara? Ma n’ezinụlọ ndị na-enwe nsogbu ma ná ndị nke na-enwe obi ụtọ, a na-enwecha nghọtahie. Ma e nwee nghọtahie n’ezinụlọ ndị na-enwe obi ụtọ, di na nwunye anaghị agwawa ibe ha okwu ọjọọ, kpọwa ibe ha iyi, ma ọ bụ kparịwa ibe ha. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ahụ na-emeso ibe ya otú ọ ga-achọ ka e si mesoo ya.—Matiu 7:12.

Gịnị mere o ji dị mkpa? E nwere ike iji ọnụ merụọ mmadụ ahụ́. Otu ilu dị na Baịbụl sịrị: “Ọ dị mma mmadụ ibi n’ala ịkpa karịa ya na nwaanyị na-ese okwu, nke na-akpasukwa mmadụ iwe, ibi.” (Ilu 21:19) E nwekwara ike ikwu otu ihe ahụ gbasara nwoke na-ese okwu. A bịakwa n’okwu ịzụ ụmụ, Baịbụl kwuru, sị: “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Ụmụaka ndị a na-abakarịrị mba nwere ike chewe na o nweghị ihe ha mere meta ndị mụrụ ha. Ha nwedịrị ike kwụsịchaa ịna-agba mbọ ime ihe ga-amasị ha.

Megodị ihe a. Jiri ajụjụ ndị a na-esonụ chọpụta ma ùnu na-akwanyere ibe unu ùgwù n’ezinụlọ unu.

◼ Ọ̀ na-abụkarị anyị nwee nghọtahie n’ezinụlọ anyị, otu onye ewere iwe pụọ?

◼ Ọ̀ na-abụ m gwawa di m ma ọ bụ nwunye m ma ọ bụkwanụ ụmụ m okwu, mụ agwa ha okwu ọjọọ ndị dị ka “onye iberiibe,” “anụ ọhịa,” ma ọ bụ ihe ndị yiri ha?

◼ Ebe m nọ too ọ̀ bụ ebe a na-agwakarị mmadụ okwu ọjọọ?

Kpebie ihe ị ga-eme. Cheta otu ihe ma ọ bụ ihe abụọ i nwere ike ime iji gosi na ị na-akwanyere mmadụ ùgwù mgbe ị na-agwa ya okwu. (Ihe ga-enyere gị aka: Kpebie na ị ga na-ekwu otú ihe mmadụ mere gị dị gị n’obi kama ịtawa onye ahụ ụta. Dị ka ihe atụ, kama ịsị, “Ị na-emekarị ihe dị otú a ma ọ bụ otú a,” sị, “O wutere m mgbe i mere ihe dị otú a ma ọ bụ otú a.)

Ọ́ gaghị adị mma ma ị gwa di gị ma ọ bụ nwunye gị ihe a i kpebiri ime? Ọnwa atọ gaa, jụọ ya otú ị gbaruru ná mbọ.

Chee ihe ụfọdụ ị ga-eme ka ị ghara ịna-agwa ụmụ gị okwu ọjọọ mgbe ị na-agwa ha okwu.

Ọ́ gaghị adị mma ma ị rịọ ụmụ gị mgbaghara maka oge ndị i ji iwe gwa ha okwu ma ọ bụ oge ndị ị gwara ha okwu ọjọọ?

[Foto dị na peeji nke 6]

Otú ahụ ebili mmiri si n’oké osimiri nwere ike ịkwapụ oké nkume, ọ bụkwa otú ahụ ka okwu ọjọọ nwere ike ime ka ezinụlọ daa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya