A Na-eme Ka A Mara Aha Chineke!
● Ọ bụrụ na ị na-agagharị n’ọmarịcha àgwàetiti nke Ọlịọn, nke dị nso na Kwibek Siti ná mba Kanada, ị ga-ahụ ihe ndị ga-egosi gị na ndị mbụ biri ebe ahụ ji okpukpe ha kpọrọ ihe. N’okporo ụzọ gara àgwàetiti ahụ gburugburu, ị ga-ahụ ụlọ ụka ndị a rụrụ ọtụtụ narị afọ gara aga, bụ́ ndị ga-echetara gị ihe ndị mere n’obodo ahụ n’oge ochie. Ị ga-achọpụtakwa na parish ọ bụla nwere ụlọ ụka nke ya.
Dị ka ihe atụ, n’obodo Senti-Piye, ị ga-ahụ ụlọ ụka a rụrụ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị afọ atọ gara aga. Ugbu a, e jizi ya mere ebe a na-egosi ihe ndị e sere ese na ihe ndị a kpụrụ akpụ. Ma, a ka nwere otu ihe pụrụ iche dị n’ụlọ ahụ. N’ahụ́ ájá ebe ọlta ya, ị ga-ahụ Tetragramatọn, nke bụ́ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ e si sụgharịta aha Chineke nke Baịbụl bụ́ Jehova.
Taa, ọ na-esi ike ịnụ ebe a kpọrọ aha Chineke n’ụlọ ụka ndị Katọlik, ya fọdụzie ịhụ ebe e dere ya ede. N’afọ 2008, otu akwụkwọ ozi si n’aka Vatikan kwudịrị na poopu nyere iwu na “a gaghị akpọ” aha Chineke n’ofufe ndị Katọlik, “a gaghịkwa ede” ya n’akwụkwọ abụ ha ma ọ bụ n’akwụkwọ ekpere ha. Ma, Baịbụl kwuru hoo haa na Jehova Chineke chọrọ ka ‘a kpọsaa aha ya n’ụwa dum.’—Ọpụpụ 9:16.
Ndịàmà Jehova kweere na otú a ga-esi eme ihe a Chineke chọrọ ka e mee abụghị naanị ide aha Chineke n’ime ụlọ ụka. N’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile na-eji ihe karịrị otu ijeri na narị nde awa ise akụziri ndị mmadụ aha Chineke na nzube ya. Ha emeela ka aha Chineke, bụ́ Jehova, dịrị n’ebe o kwesịrị ịdị. Na Baịbụl ha bipụtara, nke a na-akpọ Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, ha sụgharịrị ihe niile otú ahụ ọ dị n’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, bụ́ ebe aha Chineke bụ́ Jehova pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa. E bipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke zuru ezu na nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ihe karịrị otu narị nde na iri nde isii na ise n’asụsụ iri asatọ na atọ. N’eziokwu, a bịa n’ihe gbasara aha Chineke bụ́ Jehova, ihe anyị ga-ajụ abụghị Gịnị mere anyị ga-eji na-akpọ ya ma ọ bụ na-ede ya? kama ihe anyị ga-ajụ bụ Gịnị mere anyị ga-eji hapụ ịkpọ ya ma ọ bụ ide ya?
[Foto dị na peeji nke 30]
E bipụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, bụ́ ebe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara ihe dị ka ugboro puku asaa, ma nke zuru ezu ma nke bụ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik, n’asụsụ iri asatọ na atọ