Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 5/13 p. 3-6
  • Otú Mmadụ Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Mmadụ Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna
  • Teta!—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Rụsie Ọrụ Ike Maka Nzọpụta nke Ezinụlọ Gị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ilebara Ụmụaka Anya Otú Ahụ́ Ha Chọrọ
    Teta!—2005
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2013
g 5/13 p. 3-6

ISIOKWU TETA! A

Otú Mmadụ Ga-esi Bụrụ Ezigbo Nna

E nwere otu nwoke Saụt Afrịka aha ya bụ Michael.a Ọ na-emere nwa ya nwoke dị afọ iri na itoolu ihe niile nna kwesịrị imere nwa ya. Ma, isi anọghị nwa ahụ n’ụlọ. Ọ na-abụ nwoke a cheta ya, ya adị ya ka ò nwere ihe o kwesịrị ime nke ọ na-emeghị.

Ma, o nwere nwoke ọzọ aha ya bụ Terry. O bi na Spen. Obi na-atọ ya ụtọ mgbe ọ bụla o chetara nwa ya nwoke aha ya bụ Andrew. Nwa ya nwoke ahụ kwuru, sị: “Mgbe m dị obere, papa m na-agụrụ m akwụkwọ, mụ na ya na-egwukarịkwa egwu. Ọ na-akpọkwa m aga ebe naanị mụ na ya ga-anọ. Otú o si akụziri m ihe na-atọ m ụtọ.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ịbụ ezigbo nna adịghị mfe. Ma, o nwere ihe ụfọdụ nwere ike inyere mmadụ aka ịbụ ezigbo nna. Ọtụtụ ndị nna achọpụtala na ime ihe Baịbụl kwuru na-abara ma hanwa ma ezinụlọ ha uru. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, ndị ga-enyere ndị nna aka.

1. Gị na Ụmụ Gị Na-anọ

Olee otú i si eme ka ụmụ gị ghọta na ị hụrụ ha n’anya? Anyị ma na ị na-emere ụmụ gị ọtụtụ ihe. Dị ka ihe atụ, ị na-agba mbọ akpata ihe ha ga-eri, hụkwa na e nwere ụlọ ha bi. Ị gaghị emere ha ihe ndị a ma ọ bụrụ na ị hụghị ha n’anya. Ma, ọ bụrụ na ị naghị ewepụta oge hiri nne gị na ha ana-anọ, ha nwere ike ịna-eche na ị hụrụ ọrụ gị, ndị enyi gị, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ n’anya karịa ha.

Olee mgbe nna kwesịrị ibido wepụtawa oge ka ya na ụmụ ya na-anọ? Nne na nwa ya na-ebido dịwa ná mma mgbe nwa ahụ ka nọ n’afọ. Nwa e bu n’afọ ruo izu isii, o nwere ike malite nụwa ihe. Ya na nna ya nwekwara ike ịmalite mgbe ahụ dịwa ná mma. O nwere ike ịna-egere otú obi nwa ahụ si akụ, na otú o si na-emegharị ahụ́. O nwekwara ike ịgwa ya okwu ma ọ bụkwanụ na-agụrụ ya egwú.

Ihe Baịbụl Kwuru: N’oge ụmụ Izrel, ọ bụ ndị nwoke na-akụziri ụmụ ha ihe. A gwara ha ka ha na ụmụ ha na-anọ. Diuterọnọmi 6:6, 7 gosiri na nke a bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị, kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala nakwa mgbe i biliri ọtọ.”

2. Ezigbo Nna Na-ege Ntị Mgbe Ụmụ Ya Na-agwa Ya Okwu

Meda obi gee nwa gị ntị ma ọ na-agwa gị okwu. Abachikwala ya ọnụ

Ị chọọ ka ụmụ gị na-akọrọ gị obi ha, i kwesịrị ịna-ege ntị ma ha na-agwa gị okwu. O kwesịghị ịbụ ha na-akọrọ gị ihe ụfọdụ, iwe abịa gị.

Ọ bụrụ na ị bụ onye iwe ọkụ, ya bụrụkwa na ọ naghị ara ahụ́ gị abawara ụmụ gị mba, ọ ga na-esiri ha ike ịkọrọ gị obi ha. Ma, ọ bụrụ na ị na-emeda obi na-ege ha ntị, ha ga-aghọta na ị hụrụ ha n’anya n’eziokwu. O nweghịkwa ihe ha na-agaghị na-akọrọ gị.

Ihe Baịbụl Kwuru: Ihe Baịbụl kwuru na-enyere anyị aka ime ihe ọ bụla anyị na-eme kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Ndị nna na-eme ihe a Baịbụl kwuru na ụmụ ha na-akparịta ụka nke ọma.

3. Na-aja Ụmụ Gị Mma, Ejikwala Iwe Agwa Ha Okwu

Ị chọọ ịgwa ụmụ gị okwu ma ha mee ihe ọjọọ, gwa ha ya otú ga-eme ka ha ghọta na ị hụrụ ha n’anya nakwa na ị chọrọ ka ha baara onwe ha uru. Ihe anyị na-ekwu bụ na i kwesịrị igosi na ị hụrụ ha n’anya ma ị na-adụ ha ọdụ, ma ị na-agbazi ha, ma ị na-akụziri ha ihe, nakwa ma ị na-apịa ha ihe.

Ọ bụrụkwa na ị na-ajakarị ụmụ gị mma, ha ga-ege gị ntị mgbe ọ bụla ị na-adọ ha aka ná ntị. Ilu 25:11 kwuru, sị: “Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.” Ahụ́ na-aka eru ụmụaka ala ma ndị mụrụ ha na-aja ha mma. Ọ na-eme ka obi na-adị ha mma, na-emekwa ka ha na-agba mbọ na-akpakwu àgwà ọma.

Ihe Baịbụl Kwuru: “Unu ndị bụ́ nna, unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”—Ndị Kọlọsi 3:21.

4. Hụ Nwunye Gị n’Anya, Na-akwanyekwara Ya Ùgwù

Ụmụaka na-amụtakarị otú ọ bụla papa ha na-esi emeso mama ha ihe. O nwere ndị mụrụ gbasara otú ụmụaka si akpa àgwà. Ha kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ọma ndị nna nwere ike imere ụmụ ha bụ ịkwanyere mama ha ùgwù. . . . Obi na-adị ụmụaka mma ma papa ha na mama ha na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ha na-aghọtakwa na ha hụrụ ha n’anya.”b

Ihe Baịbụl Kwuru: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, . . . ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya dị ka ọ hụrụ onwe ya n’anya.” —Ndị Efesọs 5:25, 33.

5. Na-eme Ihe Chineke Kwuru

Ọ bụrụ na nna hụrụ Chineke n’anya, ụmụ ya ga-amụta ya. Ha ga-ahụ Chineke n’anya, ha na ya adịrịkwa n’ezigbo mma.

O nwere otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Antonio. Ọ mụrụ ụmụ isii, gbaakwa mbọ zụọ ha nke ọma. Otu ụbọchị, nwa ya nwaanyị detaara ya akwụkwọ ozi. Ihe o kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Ezigbo papa m. Ihe mere m ji detara gị akwụkwọ ozi a bụ ka m kelee gị maka otú i si zụọ m nke ọma. O meela ka m hụ ma Jehova ma onwe m ma ndị ọzọ n’anya. I mere ka m ghọta na ị hụrụ ma Jehova ma mụnwa n’anya. I meela n’otú i si jiri ọgbakọ Jehova kpọrọ ihe nakwa otú i si zụọ anyị otú Chineke chọrọ ka nna ọ bụla si zụọ ụmụ ya.”

Ihe Baịbụl Kwuru: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya. Okwu ndị a m na-enye gị n’iwu taa ga-adị n’obi gị.”—Diuterọnọmi 6:5, 6.

O doro anya na ọ bụghị naanị ihe ise a anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a ka e ji ama ezigbo nna. Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ọ sọkwara gị mee, o nweghị otú ị ga-esi meere ụmụ gị ihe niile ezigbo nna kwesịrị imere ụmụ ya. Ma, ị ga-abụ ezigbo nna ma ọ bụrụ na ị gbaa mbọ hụ ụmụ gị n’anya ma na-emere ha ihe ọ bụla ị ga-emeliri ha.c

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

b Ọ bụrụgodị na nwoke agbaa nwunye ya alụkwaghịm, ụmụ ya ka ga na-asọpụrụ mama ha ma ọ bụrụ na papa ha na-akwanyere ya ùgwù. Ha na ya ka ga-adịkwa ná mma.

c Ị chọọ ịmatakwu otú ezinụlọ gị ga-esi dịrị n’udo, gaa n’Ịntanet gụọ akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. Adres ị ga-aga gụọ ya bụ www.jw.org/ig.

Ezigbo Nna na Ụmụ Ya Na-anọ

O nwere otu nwoke Babadọs aha ya bụ Sylvan. Ya na nwunye ya na ụmụ ha nwoke atọ bi na Niu Yọk Siti. Ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ na-anya ụgbọala. Ọrụ nwoke a anaghị enye ya ohere. Ọ na-anọ n’ụzọ site n’ehihie ruo n’ihe dị ka elekere anọ nke ụtụtụ. Ọ naghị arụ ọrụ na Tọzdee na Fraịde. Ma, ọ na-arụ ọrụ n’abalị Satọdee na n’abalị Sọnde. N’agbanyeghị nke a, ọ na-ewepụta oge ya na ụmụ ya ji anọ.

Nwoke ahụ kwuru, sị: “Ọ dịrịghị m mfe. Ma m na-agba mbọ wepụta oge mụ na onye nke ọ bụla n’ime ụmụ m ji anọ. Mụ na ọkpara m na-anọ n’ehihie Tọzdee ma ọ lọta akwụkwọ. Mụ na onye nke ọ tọrọ na-anọ na Fraịdee. Mụ na nke ọdụdụ na-anọkwa n’ụtụtụ Sọnde.”

Ihe Ụfọdụ Ndị Kwuru Gbasara Papa Ha

Sierra onye dị afọ ise kwuru, sị: “Mụ na papa m na-egwu egwu. Ọ na-agụkwara m akwụkwọ n’abalị.”

Michael onye dị afọ iri kwukwara, sị: “Mụ na papa m na-egwu egwu. Ọ na-abụ anyị gwukata egwu ya asị m, ‘Oge eruola ka anyị dozie ụlọ.’ Ọ na-abụkwa anyị rụkata ọrụ, ya asị m, ‘Ngwa ka anyị gwuo egwu.’”

Onye ọzọ kwuru gbasara papa ya bụ Andrew. Ọ dị iri afọ atọ na abụọ. O kwuru, sị: “Papa m anaghị ekwe ka ọrụ ma ọ bụ egwuregwu mee ka ọ ghara inyere mama m aka n’ụlọ. Ọ na-esi nri, na-asa efere, sorokwa na-edowe ụlọ anyị ọcha. Ọ hụrụ mama m n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya