Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 5/15 p. 16
  • Uru Afụ Ọnụ Nwamba Baara Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru Afụ Ọnụ Nwamba Baara Ya
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkpụru Afụ Ọnụ Ala
    Teta!—2000
  • Ihe Mere Ụdị Ihe Dị Iche Iche Ji Nọrọ n’Ihe Ize Ndụ
    Teta!—1996
Teta!—2015
g 5/15 p. 16
Nwamba

È KERE YA EKE?

Uru Afụ Ọnụ Nwamba Baara Ya

NWAMBA na-akpakarị n’abalị. Afụ ọnụ ya na-enyere ya aka ịmata mgbe ihe dị ya nso. Ọ na-enyekwara ya aka ịnwụde anụ ọ ga-eri.

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: E nwere akwara ndị dị n’egbugbere ọnụ nwamba, bụ́ ebe afụ ọnụ ya dị. Akwara ndị ahụ gara n’ụbụrụ ya. Ọ bụ ha na-eme ka ọ dịrị ya mfe iji afụ ọnụ ya mata obere ihe ọ bụla merenụ, dị ka mgbe obere ikuku na-eku. Ọ bụ otú a akwara ndị ahụ si arụ ọrụ na-enyere nwamba aka ịmata mgbe ihe nọ ya nso, ọ bụrụgodị na ọ hụghị ya anya. Ihe a na-akacha enyere ya aka n’abalị.

Ebe ọ bụ na afụ ọnụ nwamba na-enyere ya aka ịmata na o nwere ihe nọ ya nso, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ hụghị ihe ahụ, ọ na-eji ya ama ebe anụ ọ chọrọ ịnwụde nọ. Nwamba chọọ ịba n’ọnụ, afụ ọnụ ya na-enyere ya aka ịma ma ọ̀ ga-aba ya. Otu akwụkwọ kwuru na “anyị enweghị ike ịghọtacha ọrụ niile afụ ọnụ nwamba na-arụrụ ya. Ma, ihe ga-enyere anyị aka ịghọtatụ ya bụ ihe na-eme ma a chapụ ya. Nwamba anaghị emeli ihe ọ bụla ma a chapụ afụ ọnụ ya.”

Ndị ọkachamara na-agbasi mbọ ike ka ha rụpụta robọt ga-enwe ihe ndị ga-enyere ya aka ịmata mgbe o ruru ihe ọ bụla nso, otú ahụ afụ ọnụ nwamba si enyere ya aka ịmata mgbe ọ bụla ihe nọ ya nso. Otu ọkachamara na-akụzi sayensị na Mahadum Kalịfọnịa dị n’Amerịka kwuru na ihe ndị ahụ ga-eme ka a rụpụta robọt bụ́ ọkpọka nakwa ihe ndị ọzọ a ga-eji na-agwa kọmputa na ígwè ọrụ ndị ọzọ ihe ha ga-eme.

Gịnị ka i chere? Otú afụ ọnụ nwamba si arụ ọrụ ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya