Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 4 p. 12-13
  • Mgbe M Gara Kegịstan

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mgbe M Gara Kegịstan
  • Teta!—2016
Teta!—2016
g16 nke 4 p. 12-13
Foto obere ụlọ ndị yiri ụlọikwuu. Ha dị n’ala ala ugwu Tash Rabat nke dị na Kegịstan

Ihe ndị a bụ obere ụlọ yiri ụlọikwuu. Ha dị n’ala ala ugwu Tash Rabat

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Kegịstan

Map Kegịstan

KEGỊSTAN dị n’etiti Eshia. Ọtụtụ ugwu gbara ya gburugburu, snoo na-ekpuchikarịkwa ugwu ndị ahụ. Obodo ndị gbara ya gburugburu bụ Kazakstan, Uzbekịstan, Tajikistan, na Chaịna. Kegịstan bụ nnọọ ugwu ugwu. Ọ dị n’elu elu otu ugwu a na-akpọ Tian Shan. Ugwu a dị n’ọtụtụ obodo dị n’Eshia. Ọhịa adịchaghị n’obodo a. Ma, otu ihe pụrụ iche bụ na ụkpa juru n’ọhịa ndị nke dị na ya. O so n’obodo ndị ụkpa hiri nne na ha.

Ebe Onyeàmà Jehova na-amụrụ otu nwaanyị Kegịstan Baịbụl

Ndịàmà Jehova na-amụrụ ọtụtụ puku ndị bi na Kegịstan Baịbụl

Ihe e ji mara ndị Kegịstan bụ na ha na-anabata mmadụ nke ọma, na-akwanyekwara mmadụ ùgwù. Ha na-akwanyere onye tọrọ ha ùgwù ma ha gwawa ya okwu. Ha na-ebiliri ya n’oche, na-ahapụkwara ya oche kacha mma.

Ndị obodo ahụ na-amụ ụmụ atọ ma ọ bụ karịa. Nwa ha nwoke nke ọdụdụ na nne ya na nna ya na-ebikarị, ma ọ̀ lụrụ nwaanyị ma ọ lụghị. Ọ bụkwa ya ga-ele ha nká.

Ha na-ebido mgbe nwa ha nwaanyị ka dị obere kụziwere ya otú nwaanyị kwesịrị isi na-arụ ọrụ n’ụlọ. Mgbe nwa ahụ na-erule afọ iri na ise, o nweghị ọrụ nwaanyị na-arụ n’ụlọ ọ na-agaghị ama otú e si arụ ya. Ọ lawa di, a na-edu ya ụlọ. Ihe ụfọdụ ha nwere ike inye ya bụ ákwà dị iche iche, ma ndị nke e ji ehi ụra, ma ndị nke a na-eyi eyi, nakwa kapet ndị e ji aka kpaa. Di na-alụ ya nwere ike iji ego ma ọ bụ anụmanụ kwụọ ụgwọ isi ya.

Ha na-egbukarị atụrụ ma ọ bụ ịnyịnya ma ha liwe ozu ma ọ bụ mewe ememme ndị ọzọ. Ha na-eke anụ ya, mpaghara nke ọ bụla nwere onye a na-ekenye ya. A na-esi n’onye nke tọchara ma ọ bụkwanụ onye nke ọkwá ya kacha kere gbadawa n’ihi otú ha na-esi akwanyere mmadụ ùgwù. Ha na-erikwa nri ha na-akpọ beshbamak n’ememme ha. Ọ bụ aka ka ha na-eji eri ya.

Ebe otu nwa okorobịa ji ihe ha na-akpọ komuz na-akpọ egwú

Ha na-akpọ ihe a Komuz. Ha na-ejikarị ya akpọ egwú

IHE ỤFỌDỤ I KWESỊRỊ ỊMA BANYERE KEGỊSTAN

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? n’asụsụ Kejiz. Akwụkwọ a dịkwa na www.jw.org/ig

  • Mmadụ ole bi na ya: 5,776,000

  • Isi obodo ya: Bishkek

  • Asụsụ ndị ha na-asụ: Kejiz na Rọshịan

  • Ihe ndị ha na-eresị ndị mba ọzọ: Ogho, owu, ọlaedo, mekuri, na yurenịọm

  • Okpukpe: E kee ndị obodo a ụzọ iri, ụzọ asatọ na-ekpe Alakụba

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya