IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU
Gịnị Na-akpata Nchegbu?
Otu ụlọ ọgwụ a ma ama bụ́ Mayo Clinic kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị torola eto kwuru na nchegbu ha na-akakwu njọ. Ọtụtụ ihe na-agbanwe kwa ụbọchị, o nweghịkwa ihe e ji n’aka.” Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị na-eme ka nchegbu na-aka njọ:
ịgba alụkwaghịm
ọnwụ mmadụ
ọrịa
ihe mberede
ime mpụ
ndụ gbalụ gbalụ
ọdachi ndị na-emere onwe ha na ndị nke mmadụ na-akpata
nsogbu a na-enye ndị mmadụ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọrụ
oké echiche n’ihi enweghị ọrụ na ego