Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 67
  • Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Nyeere Jehoshafat Aka
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ị̀ Ga-echebara Ihe Ndị E Dere n’Oge Gara Aga Echiche?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Na-ele Ndị Ọzọ Anya Otú Jehova Si Ele Ha
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2023
  • Jiri Obi Gị Niile Na-efe Jehova
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 67
Ndị na-abụ abụ nọ n’ihu ndị agha Jehoshafat

AKỤKỌ NKE 67

Jehoshafat Atụkwasị Jehova Obi

Ị̀ MA ndị ndị a bụ na ihe ha na-eme? Ha na-eje ịlụ agha. Ndị ikom nọ ha n’ihu na-abụ abụ. Ma ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Olee ihe mere ndị ahụ na-abụ abụ ejighị mma agha na ube ha ga-eji lụọ agha?’ Ka anyị hụ.

Jehoshafat bụ eze nke ebo abụọ nke alaeze Izrel. Ọ dịrị ndụ n’otu oge ahụ Eze Ehab na Jezibel nke alaeze ebo iri dịrị ndụ. Ma Jehoshafat bụ eze ọma, nna ya bụ́ Esa bụkwa eze ọma. N’ihi ya, ndị nọ n’ebo abụọ nke alaeze dị n’ebe ndịda nwere obi ụtọ na udo ruo ọtụtụ afọ.

Ma, ọ dị otu ihe merenụ nke mere ka egwu jide ha. Ndị ozi gwara Jehoshafat, sị: ‘Oké ìgwè ndị agha si ná mba Moab, Amọn, na Ugwu Sia na-abịa ibuso gị agha.’ Ọtụtụ ndị Izrel zukọrọ na Jeruselem iji chọọ enyemaka Jehova. Ha gara n’ụlọ nsọ Chineke, Jehoshafat wee nọrọ n’ebe ahụ kpegara Jehova ekpere, sị: ‘O, Jehova Chineke anyị, anyị amaghị ihe anyị ga-eme. Ike anyị na ìgwè ndị agha a ahaghị. Biko nyere anyị aka.’

Jehova ṅara ntị wee mee ka otu n’ime ndị ozi ya gwa ha, sị: ‘Ọ bụghị unu nwe agha ahụ, ọ bụ nke Chineke. Unu agaghị alụ ọgụ. Cherenụ ma hụ ka Jehova ga-esi zọpụta unu.’

N’ụtụtụ echi ya, Jehoshafat gwara ha, sị: ‘Tụkwasịnụ Jehova obi!’ O wee debe ndị na-abụ abụ n’ihu ndị agha ya. Ka ha na-agakwa, ha na-abụku Jehova abụ otuto. Ị̀ ma ihe mere mgbe ha ruru ọgbọ agha ahụ nso? Jehova mere ka ụsụụ ndị agha nke ndị iro ha lụrịta ọgụ n’etiti onwe ha. Mgbe ndị Izrel rutere, nke ọ bụla n’ime ndị agha ahụ bụ́ ndị iro ha anwụwo!

Ọ̀ bụ na amamihe adịghị ná ntụkwasị obi Jehoshafat nwere n’ebe Jehova nọ? Anyị ga-abụkwa ndị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi.

1 Ndị Eze 22:41-53; 2 Ihe E Mere 20:1-30.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya