Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gt isi 67
  • Ha Ejideghị Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Ejideghị Ya
  • Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mụta Ihe Site n’Ihe Mere Nikọdimọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Jizọs Akụziere Nikọdimọs Ihe n’Abalị
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Izi Nikọdimọs Ihe
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
gt isi 67

Isi 67

Ha Ejideghị Ya

KA Ememe Ụlọ Ikwuu ka na-aga n’ihu, ndị ndú okpukpe zipụrụ ndị uwe ojii ka ha jee jide Jisọs. Ọ nwaghị izopu onwe ya. Kama nke ahụ, Jisọs nọgidere na-ezi ihe n’ihu ọha, na-asị: “Ọ fọdụrụ nwa oge mụ na unu ga-anọ, m wee lakwuru onye zitere m. Unu ga-achọ m, ma unu agaghị achọta m: ebe mụ onwe m nọkwa, unu onwe unu apụghị ịbịa.”

Ndị Juu ahụ aghọtaghị ya, ya mere ha jụrịtara onwe ha, sị: “Olee ebe onye a gaje ịga na anyị onwe anyị agaghị achọta ya? Ọ̀ gaje ịgakwuru ndị gbasara n’etiti ndị Grik na izi ndị Grik ihe? Gịnị bụ okwu a nke o kwuru, sị, Unu ga-achọ m, ma unu agaghị achọta m: ebe mụ onwe m nọkwa, unu onwe unu apụghị ịbịa?” Otú ọ dị, Jisọs na-ekwu banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gaa ná ndụ eluigwe nke na-eru nso, bụ́ ebe ndị iro ya na-apụghị isoro ya jee.

Ụbọchị nke asaa, bụ́kwa nke ikpeazụ nke ememe ahụ erutewo. N’ụtụtụ ọ bụla nke ememe ahụ, otu onye nchụàjà na-awụpụ mmiri, bụ́ mmiri nke o kutere n’Ọdọ Mmiri nta nke Saịloam, na-eme ka o rudaa n’okpuru ebe ịchụ àjà ahụ. Eleghị anya iji chetara ndị mmadụ ahụ banyere ihe nke a a na-eme kwa ụbọchị, Jisọs tiri mkpu, sị: “Ọ bụrụ na akpịrị kpọrọ mmadụ ọ bụla nkụ́, ya bịakwute m, ṅụọ mmiri. Onye na-ekwere na mụ, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ kwuru, n’afọ ya ka osimiri nke mmiri dị ndụ ga-esi na-erupụta.”

N’ezie, ihe Jisọs na-ekwu n’ebe a bụ banyere ihe ukwu nke ga-eme mgbe ọ wụpụsịrị mmụọ nsọ ahụ. N’afọ nke na-eso, e nwere mwụpụ nke mmụọ nsọ ahụ na Pentikọst. N’ebe ahụ mmiri nke na-enye ndụ malitere irupụta mgbe 120 ndị na-eso ụzọ malitere ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ma ruo mgbe ahụ, e nweghị mmụọ ọ bụla n’echiche nke bụ na ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst nke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ma nye ya ọkpụkpọ òkù nke ndụ eluigwe.

N’ịzaghachi n’ozizi Jisọs, ụfọdụ malitere ikwu, sị: “N’ezie onye a bụ onye amụma ahụ,” ma eleghị anya na-eburu onye amụma ahụ nke ga-aka Mosis ukwuu n’uche, bụ́ nke e kwere nkwa na ọ ga-abịa. Ndị ọzọ sịrị: “Onye a bụ Kraịst anyị.” Ma ndị ọzọ megidere ya, na-asị: “Gịnị, ọ̀ ga-abụ na Galili ka Kraịst anyị si bịa? Akwụkwọ nsọ ó kwughị na Kraịst anyị na-esi ná mkpụrụ Devid bịa, sitekwa na Betlehem, bụ́ obodo nta nke Devid nọrịị?”

Ya mere e nwere nkewa n’etiti ìgwè mmadụ ahụ. Ụfọdụ chọrọ ka ejide Jisọs, ma ọ dịghị onye na-atụkwasị ya aka. Mgbe ndị uwe ojii ahụ lọghachiri ma ghara ịkpụta Jisọs, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii jụrụ, sị: “N’ihi gịnị ka unu na-ekutaghị ya?”

Ndị ọrụ ahụ na-azaghachi sị, “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.”

N’oké iwe, ndị ndú okpukpe ahụ malitere ịkwa emo, ime akaja na ịkpọ ndị uwe ojii ahụ aha ọjọọ. Ha mara ha njakịrị, sị: “È duhiewokwa unu onwe unu? Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti ndị isi ma ọ bụ n’etiti ndị Farisii, kwere na ya? Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị Iwu anyị bụ ndị a na-abụ ọnụ.”

Na nke a, Nikọdimọs, bụ́ onye Farisii na onye ọchịchị ndị Juu (ya bụ, onye so n’òtù Sanhedrin), nwara ikwuchitere Jisọs. Ị pụrụ icheta na n’afọ abụọ na nkera gara aga, ­Nikọdimọs bịakwutere Jisọs n’abalị ma gosi okwukwe na ya. Ugbu a Nikọdimọs sịrị: “Iwu anyị ọ̀ na-ekpe mmadụ ikpe, ọ bụrụ na o bughị ụzọ nụrụ n’ọnụ ya, wee mara ihe ọ na-eme?”

O wutere ndị Farisii ahụ ọbụna karịa n’ihi na otu onye n’ime ha kwuchiteere Jisọs. N’ụzọ nkwulu, ha na-azaghachi sị, “Gị onwe gị [ị̀] sikwa na Galili pụta? Nyochaa n’akwụkwọ nsọ, leekwa na ọ dịghị onye amụma si na Galili bilie.”

Ọ bụ ezie na Akwụkwọ nsọ ekwughị kpọmkwem na onye amụma ga-esite Galili, ọ na-ezo aka na Kraịst sitere n’ebe ahụ, na-ekwu na a ga-ahụ “oké ìhè” n’ókèala ebe ahụ. Ọzọkwa, a mụrụ Jisọs na Betlehem, ọ bụkwa onye sitere n’usoro ọmụmụ Devid. N’agbanyeghị na ma eleghị anya ndị Farisii matara nke a, ọ bụ ha kpatara mgbasa nke nghọtahie ndị mmadụ nwere banyere Jisọs. Jọn 7:32-52; Aịsaịa 9:1, 2; Matiu 4:13-⁠17.

▪ Gịnị na-eme n’ụtụtụ ọ bụla nke ememe ahụ, n’ụzọ dị aṅaa ka ọ pụrụ isi bụrụ na Jisọs na-adọrọ uche gaa na nke a?

▪ N’ihi gịnị ka ndị ọrụ ahụ ji ghara ijide Jisọs, ndị ndú okpukpe ahụ sikwa aṅaa meghachi omume?

▪ Ònye bụ Nikọdimọs, gịnị bụ omume ya n’ebe Jisọs nọ, oleekwa otú ndị Farisii ibe ya si mesoo ya omume?

▪ Ihe àmà dị aṅaa na-egosi na Kraịst ahụ ga-esite Galili?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya