Isi 94
Mkpa Maka Ekpere na Ịdị Umeala n’Obi
N’OGE gara aga, mgbe ọ nọ na Judia, Jisọs kọrọ otu ihe atụ nke metụtara ịdị mkpa nke ịnọgide na-ekpe ekpere. Ugbu a, n’ojije ikpeazụ ọ na-eje Jerusalem, o meghachikwara ka ọ pụta ìhè mkpa ọ dị ịnọgide na-ekpe ekpere. Ọ pụrụ ịbụ na Jisọs ka nọ na Sameria ma ọ bụ Galili mgbe ọ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya ihe atụ ọzọ nke a:
“Otu onye ikpe nọ n’otu obodo, onye na-adịghị atụ egwu Chineke, nke na-adịghị asọpụrụkwa mmadụ: otu nwanyị nke di ya nwụrụ nọkwa n’obodo ahụ; nwanyị ahụ wee na-abịakwute ya, na-asị, Kpepụta m n’aka onye iro m. Ma na mbụ ọ chọghị ime ya: ma e mesịa ọ sịrị n’onwe ya, Ọ bụ ezie na adịghị m atụ egwu Chineke, adịghị m asọpụrụkwa mmadụ; ma n’ihi na nwanyị a di ya nwụrụ na-esogbu m, m ga-ekpepụta ya, ka ọ ghara ime ka ike gwụsịa m site n’ọbịbịa ọ na-abịa mgbe nile.”
Jisọs wee kọwaa ihe akụkọ ya pụtara na-asị: “Nụrụnụ ihe onye ikpe nke na-eme ajọ omume kwuru. Ma Chineke, ọ́ gaghị ekpepụta ndị nke ya a họpụtara, ndị na-akpọku ya ehihie na abalị, o nwekwara ogologo ntachi obi n’ebe ha nọ?”
Ihe Jisọs na-ekwu abụghị na ọ dị ụzọ ọ bụla Jehova Chineke si yie onye ikpe ajọ omume ahụ. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na ọbụna onye ikpe ajọ omume ga-azaghachi mgbe a nọgidere na-arịọ ya arịrịọ, e kwesịghị inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na Chineke, onye bụ nnọọ onye ezi omume na onye dị mma ga-azaghachi ma ọ bụrụ na ndị ya adaghị mbà n’ikpe ekpere. Ya mere, Jisọs gara n’ihu, sị: “Asị m unu, na [Chineke] ga-ekpepụta ha ọsọ ọsọ.”
Ọtụtụ mgbe, a na-eme ka ndị dị ala na ndị ogbenye ghara inweta ikpe ziri ezi, ebe ndị dị ike na ndị bara ọgaranya na-enweta ihu ọma mgbe mgbe. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị na Chineke ga-ahụ na e nyere ndị mmebi iwu ahụhụ n’ụzọ ikpe ziri ezi, kama ọ ga-ahụkwa na e mesoro ndị ohu ya omume n’ụzọ ikpe ziri ezi site n’inye ha ndụ ebighị ebi. Ma, ọ̀ bụ mmadụ ole kwenyesiri ike na Chineke ga-ahụ na e mere ihe n’ikpe ziri ezi ọsọ ọsọ?
N’izo aka karịsịa n’okwukwe nke e jikọtara ya na ike nke ekpere, Jisọs jụrụ, sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa, ọ̀ ga-ahụ okwukwe n’elu ụwa?” Ọ bụ ezie na ọ hapụrụ ajụjụ ahụ n’azaghị ya aza, ọ pụrụ ịbụ na isi ihe dị na ya bụ na okwukwe dị otú ahụ agaghị abụ ihe a na-ahụ ebe nile mgbe Kraịst ga-abịa n’ike Alaeze.
Ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-ege Jisọs ntị bụ ndị onwe ha juru afọ na ha nwere okwukwe. Ha tụkwasịrị onwe ha obi na ha bụ ndị ezi omume, ha na-eledakwa ndị ọzọ anya. Ọbụna ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs pụrụ iso ná ndị a. Ya mere, o bu ndị dị otú a n’uche wee kọọ ihe atụ nke a na-esonụ:
“Ndị ikom abụọ rịgoro n’ụlọ ukwu Chineke ikpe ekpere; otu n’ime ha bụ onye Farisii, ibe ya bụ onye ọna ụtụ. Onye Farisii guzoro na-ekpe ekpere nye onwe ya otú a, sị, Chineke, ekelee m gị, na adịghị m ka ndị fọdụrụ n’etiti mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko, ma ọ bụ dị ka ọbụna onye ọna ụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugbo abụọ n’izu ụbọchị asaa; ana m enye otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe nile, ka ha hà, bụ nke m natara.”
A ma ndị Farisii ama n’ihi ngosipụta ezi omume ha ne-eme n’ihu ọha ka ndị ọzọ wee jaa ha mma. Ụbọchị ibu ọnụ nke ha bokwasịrị onwe ha na-abụkarị Monday na Thursday, ha jikwa omume ịgbasobiga iwu ókè na-akwụ otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọbụna akwụkwọ nri ndị kasị nta e nwetara n’ubi. Ọnwa ole na ole tupu mgbe ahụ, nleda anya ha nwere n’ebe ndị nkịtị nọ pụtara ìhè n’oge Ememe Ụlọ Ikwuu, bụ́ mgbe ha sịrị: “Ma ìgwè mmadụ a nke na-amaghị iwu anyị [ya bụ ụzọ ndị Farisii si kọwaa ya] bụ ndị a na-abụ ọnụ.”
N’ịga n’ihu n’ihe atụ ya, Jisọs kọrọ banyere otu n’ime “ndị a na-abụ ọnụ” dị otú ahụ, sị: “Ma onye ọna ụtụ ahụ guzoro n’ebe dị anya, ọ chọghịkwa iweli ọbụna anya ya lee eluigwe, kama ọ na-eti aka n’obi ya, sị, Chineke, ka obi gị jụrụ n’ebe mụ, bụ́ onye mmehie, nọ.” N’ihi na onye ọna ụtụ ahụ ejiriwo obi umeala nakwere mmehie ya, Jisọs kwuru, sị: “Asị m unu, Nwoke a rịdara n’ụlọ ya bụrụ onye a gụworo n’onye ezi omume karịa ibe ya: n’ihi na onye ọ bụla nke na-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; ma onye na-eweda onwe ya: a ga-eweli ya elu.”
Otú a, Jisọs mesiri ya ike ọzọ bụ́ mkpa ọ dị ịdị umeala n’obi. Ebe ọ bụ na a zụlitere ha n’ógbè ebe ndị Farisii ahụ bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha nwere mmetụta dị ukwuu, ebe a na-emesikarịkwa ọnọdụ na ọkwá mmadụ nọ na ya ike nke ukwuu, ọ bụghị ihe ịtụnanya na nke a metụtara ọbụna ndị na-eso ụzọ Jisọs. Ma, lee ezi ihe mmụta banyere ịdị umeala n’obi nke Jisọs na-akụzi! Luk 18:1-14; Jọn 7:49.
▪ N’ihi gịnị ka onye ikpe ajọ omume ahụ ji meere nwanyị ahụ di ya nwụrụ ihe ọ na-arịọ, oleekwa ihe mmụta dị n’ihe atụ ahụ Jisọs kọrọ?
▪ Okwukwe dị aṅaa ka Jisọs ga-achọ ịhụ mgbe ọ bịara?
▪ Olee ndị Jisọs bu n’uche mgbe ọ na-akọ ihe atụ ya banyere onye Farisii ahụ na onye ọna ụtụ?
▪ Omume dị aṅaa nke ndị Farisii kwesịrị ka e zere?