Mkpụrụ Obi Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Anwụ Anwụ?
▸ Ihe ka n’ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ihe dị n’ime mmadụ—mkpụrụ obi, mmụọ—adịghị anwụ anwụ, na-adịgidekwa ndụ mgbe a nwụsịrị. Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?
▸ Olee otú ozizi anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi si malite?
▸ Olee otú nkụzi a si ghọọ akụkụ dị mkpa nke ihe ka n’ọtụtụ okpukpe nke oge anyị?
▸ Gịnị n’ezie bụ mkpụrụ obi?
▸ Gịnị mere anyị ji anwụ anwụ?
▸ Gịnị na-eme mkpụrụ obi n’ọnwụ?
▸ Olileanya dị aṅaa dịịrị ndị nwụrụ anwụ—na ndị dị ndụ?
▸ Ihe i kweere banyere mkpụrụ obi ò nwere ihe o mere n’ezie?
A na-achọta azịza ndị bụ eziokwu, na-ejukwa afọ nye ajụjụ ndị a n’akwụkwọ kasị ochie e detụworo. A na-akpọ gị òkù inyocha ha n’ime broshuọ a.