NKEBI NKE 2
Onye “Na-ahụ Ikpe Ziri Ezi n’Anya”
Ikpe na-ezighị ezi juru ebe nile n’ime ụwa nke taa, a na-atakwa Chineke ụta dị ukwuu n’ụzọ na-ezighị ezi maka ya. Ma, Bible na-akụzi otu eziokwu nke na-akasi obi—na Jehova “na-ahụ [ikpe ziri ezi] n’anya.” (Abụ Ọma 37:28) Ná nkebi a anyị ga-amụta otú o siworo gosipụta na okwu ndị ahụ bụ eziokwu, na-eme ka ihe nile a kpọrọ mmadụ nwee olileanya.